Full Lyrics
[REFRAIN]
Jesu chekwaba mkpur'obi ya
Jesu chekwaba mkpur'obi ya n'ụlọ gị doo
Ị gaghị ekwe ka mkpur'obi ya
Re ure n'ala ndị mmụọ
[VERSE 1]
Mkpur'obi i kere n'oyiyi gị Jesu
Mkpur'obi i kere n'ụdị a nwụghị anwụ
Lee nụ k'o togboro, lee nụ k'o guzoro Jesu
Ọ gaghị ere n'ata ure n'ili ọnwụ
[VERSE 2]
Chukwu a hapụghị nwa ya ka o re ure n'ili
Chukwu a hapụghị nwa ya ka o laa n'iyi
Chukwu meriri ili, merie ọnwụ, merie mmehie
Chekwaba obi ya o n'ebe nsọ gị
[VERSE 3]
Mgbe ị gaakpọ ndị kwere ekwe
N'ụda opi ike nke igwe
Mgbe ị gaakpọ ha nọ gbara ndị mmụọ ozi
Cheta m o Jesu, cheta m o
A bụ m onye njọ
[VERSE 4]
Onye iro bịara izuru
Onye iro bịara ka o gbue ka o bibisia
Ụmụ nke Chukwu
Chim o ekwela, Chim o ekwela
Ka onye iro mkpur'obi metụma aka