Full Lyrics
[Tenor Solo]
Oge eruo
Ọha obodo zụkọ zụkọ
Bịanụ k'anyị fee makpọ isiala nye Onye nwe anyị
Maka n'Ọ bụ Eze leeii
Eze ndị eze
Abụm Ihem bụ
Ọchiagha
Oke Mmụọ naeri aja
Ọdịbara gbo gbo gbo gbo gbo gbo gbo
Isiala n'Ọ bụ Gị nwe ya o
[Tutti]
Bịanụ k'anyị jee fee Chukwu kere anyị Nwa
Bịa n'ihu Chineke
Bịanụ k'anyị jee nye Ya ekele dị mma
Chineke bụ Onye n'asị anyị bịa
k'anyị fee Nna n'Obi Ya maka n'ọmasịrị Ya
Chineke bụ Onye n'asị anyị bịa
Kpọrọ Ya isiala nye Ya Otito ruru Ya
Bịanụ Ụmụnne m Doo Bịanụ
n'ihu Chukwu were ọbịa nụrị
n'enye Ya ekele
n'ọ naechekwaba anyị o
Chukwu Okike
Chinke kere anyị n'Oyiyi Ya O
Chinke nyere sọ Otu Nwa Ya Kristi
Chinke zitere anyị Mmụọ Nsọ Onye ntasi Obi,
Isiala mu o Nna sọ Gị nwe ya.
Ezi Chineke N'ihi n'Ị hụrụ ụwa n'anya
Ị nyere sọ Otu Nwa Gị Jeso Kristi
ka Ọ gbapụta anyị o
Chi obiebere doo Nna
nara ofufe anyị o
Ịkpọrọ Gị egwu Otito dị mma
Chi obiebere doo Nna
Ezi Chukwu Ezi Chukwu Ezi Chukwu anyị o Nna
nara ofufe anyị o
Ode jim jim Nwoke teghete
Chi obiebere doo Nna
Ezi Chukwu Ezi Chukwu Ezi Chukwu anyị o Nna
nara ofufe anyị o
Ide Ide Igirigi ndụ
Chi obiebere doo Nna
Ezi Chukwu Ezi Chukwu Ezi Chukwu anyị o Nna
nara ofufe anyị o
Chi ka Ọ mee Chi Odogwu
Chi obiebere doo Nna
Ezi Chukwu Ezi Chukwu Ezi Chukwu anyị o Nna
nara ofufe anyị o
Nwa mgbada chiri uche n'aka
Chi obiebere doo Nna
Ezi Chukwu Ezi Chukwu Ezi Chukwu anyị o Nna
nara ofufe anyị o
Dike Dike ndị kerere
Chi obiebere doo Nna
Ezi Chukwu Ezi Chukwu Ezi Chukwu anyị o Nna
nara ofufe anyị o
rue na ndụ duga ndụ
Chi obiebere doo Nna
Ezi Chukwu Ezi Chukwu Ezi Chukwu anyị o Nna
[Sotto VoceChoir Ostinato for Soprano Solo]
Onye bụ Eze, Eze Ebube?
Eze Ebube n'akpọ eh k'anyị jee nye
Ọ bụ Ya bụ Eze m a Chukwu
Chi Okike Ukwu
Chikere anyị jee nye
Eze gaadịgide ma chigide
Isiala sọ Gị nwe Ya
Ew! Isiala sọ Gị nwe Ya
Kpọọ Isiala Isiala Jebenu Jebenu
[Soprano Solo]
Eze Ebube mu o
Eze nachị ụwa niile
Ọchiagha
Chinke kere eluigwe n'ala
mana ọ dighi chi kere Ya
Taata Ị nụrụ Olu Ya Ee
Olu Chukwu n'ekwu Nwa m'e eh,
akpọchikwala obi gị
maka n'ọ naewe kwa m iwe Ee
Chi m Ebube Dike
Igwe Chi m Ebube Dike
Anyị ekele nara ofufe ụmụ Gị
Isiala sọ Gị nwe Ya!
[Choir]
Otito Otito
Otito dịrị Nna Nwa na Mmụọ Nsọ
Amen! A...
Amen! A...
Amen! Praise God!