Ikenna by Jude Nnam — Lyrics

Jude Nnam Igbo Offertory Hymns Celebrations Hymns Solfa notation

Full Lyrics

REFRAIN Ikenna, Ike ya n'edu mo n'uwa Ike Chukwu, Ikem ji eje mba lee n'uwa K'anyi jee kele ya, jenu kele ya, O meela! Kele ya n'odi ebube, Si ya Nna n'o meela! Kelee Chineke, Si ya daalu, O meela! Chukwu kere uwa choo ya nma, O meela! VERSE 1 Omumu adighi mfe, O bukwa n'ike nnamo! Omumu siri ike, O bukwa n'ike Chukwu o! Nwanyi tur'ime, muo nwa n'udo Kelee Chukwu o, O bukwa n'ike ya! VERSE 2 Ahu isike, O bukwa n'ike nnamo! Ahu idi nma, O bukwa n'ike Chukwu o! Hapugbasi ike, Chineke jiri ya choo gi nma; Kelee Chukwu o, O bukwa n'ike ya! VERSE 3 I nwere ego? O bukwa n'ike nnamo! I nwere aku n'uba? Ha bukwa n'ike Chukwu o! Were ha fee Chukwu, nyere mmadu ibe gi aka Aku amaka! Ha bukwa n'ike ya!

Download the sheet music

Ikenna

Ikenna

By Jude Nnam
Solfa
Igbo
3 pages
4 Downloads
Offertory Hymns Celebrations Hymns
0 0

More lyrics you may want