IKE EUCHARISTỊA DỊ ASỌ by Virgilus C. Eze — Lyrics

Virgilus C. Eze Igbo Communion Hymns Hymns Solfa notation

Full Lyrics

VERSE ONE Achịcha si n'igwe nriọma Kristi nyere anyị ọ bara dị oke ọnụ mmanyaọma bụ ike n'onwe ya. Kristi naakpọ anyị k'anyi jee rie ma nụọ maka na ike dị na Eucharistịa dị asọ. CHORUS Ike ike, Ike ike ike dị na Eucharistịa. Ike dị na Eucharistịa dị asọ. Nnukwu ike dị na Eucharistịa dị asọ. Ike dị n'ahụ n'ọbara Jeso Kristi. Onye riri ya bụ achịcha ma nụkwa mmanya ọma a gaanata, ọ gaanata ike adim asọ Jeso gaebiri n'ime ya. VERSE TWO Mere Jeso mere achịcha ka ọ ghọrọ ahụ ya ma mekwazia manya ka ọ ghọrọ ọbara ya. Kristi naakpọ anyị k'anyi jee rie ma nụọ maka na ike dị na Eucharistịa dị asọ. VERSE THREE N'ezie ọ bụ nnukwu ih'itunaya nyere anyị na Kristi were onwe ya nye anyi n'ụdị achịcha na mmanya. Ginizi kpatara anyi ji jụ ịnata ya? Ngwa k'anyi bilie jee rie ma nụọ maka na ike dị na Eucharistịa dị asọ. VERSE FOUR Oriri dị asọ n'abawanye ndụ nke gratia n'ime anyi wee naebenatara anyi oliwala wala naagụụ ime njọ. Naenye kwazi anyi mbe nke ndụ ebebe ọ bụ ya mere Kristi ji akpọ anyi k'anyi jee rie ma nụọ maka na ike dị na Eucharistịa dị asọ.

Download the sheet music

IKE EUCHARISTỊA DỊ ASỌ

IKE EUCHARISTỊA DỊ ASỌ

By Virgilus C. Eze
Solfa
Igbo
4 pages
20 Downloads
Communion Hymns Hymns
1 0

More lyrics you may want