Full Lyrics
VERSE 1
Achịcha si n'igwe nrịọma Kristi nyere anyị
Ọbara dị oke ọnụ mmanyaọma bụ ike n'onwe ya
Kristi naakpọ anyị k'anyi jee rie ma nụọ
Maka ntị n'ezie ike dị na Eucharistia nke n'enye ndụ
CHORUS
Ike ike ike dị na Eucharistia
Ike ike ike dị na Eucharistia
Ike ike ike, nnukwu ike dị na nwa nne m
Ike dị n'ahụ n'ọbara Jeso Kristi
Onye riri ya nụkwa mmanya ọma a gaanata
Nata ike adị m asọ
Jeso gaebiri n'ime ya
VERSE 2
Jeso mere achịcha ka ọ ghọrọ ahụ ya
Mekwazia manya ka ọ ghọrọ ọbara ya
Kristi naakpọ anyị k'anyi jee rie ma nụọ
Maka ntị n'ezie ike, gee m ntị n'olu
Ike ike ike dị na ya ike
VERSE 3
N'ezie ọ bụ nnukwu ihe itụnanya nyere anyị
Na Kristi were onwe ya nye anyi n'ụdị achịcha na mmanya
Gịnịzị kpatara anyi ji jụ ịnata ya?
Ngwa k'anyi bilie jee rie ma nụọ
Maka ntị n'ezie ike, gee m ntị n'olu
Ike ike ike dị na ya ike
VERSE 4
Oriri dị asọ n'abawanye ndụ nke gratia n'ime anyị
Wee naebenatara anyị ọlịwalawala naagụụ ime njọ
Naenyekwazi anyị mbe nke ndụ ebebe
Ọ bụ ya mere Kristi ji akpọ anyị k'anyi jee rie ma nụọ
Maka ntị n'ezie ike, gee m ntị n'olu
Ike ike ike dị na ya ike
Dị na Eucharistia dị asọ