BATA BIRI N'IME OBI M by Gerald C. Ani — Lyrics

Gerald C. Ani Igbo Communion Hymns Eucharistic songs Hymns Staff & Solfa notation

Full Lyrics

[DUET INTRODUCTION] Bata biri n'ime obi m, Jesu, Bata biri n'ime obi m, Nwa Chineke. Bata bia biri n'ime obi m, bia nye m ndụ biko, Bata gwọọ mkpụrụ obi m, daara m mba bata, Ekwel' ajọ onye bata. Bata biri n'ime obi m, Jesu, Bata biri n'ime obi m, Nwa Chineke. Bata bia biri n'obi m, bia nye m ndụ biko, Bata gwọọ mkpụrụ obi m, daara m mba bata, Ekwel' ajọ onye bata. [REFRAIN] Nwa Chineke bata, Achịcha mara mma bata, Bia biri n'obi m, Jesu bata, Bia biri n'obi m, achịcha si n'igwe Jesu Kristi, Bia biri n'obi m, Jesu bata, Bia biri n'obi m, O n'obi m, Jesu bata, Bia biri n'obi m, Jesu bata, Bia biri n'obi m, Achịcha na mmanya si n'igwe O bata, Bata Jesu bata, Bia biri n'obi m, Jesu bata, Bia biri n'obi m, ekwel' ajọ onye bata. [VERSE 1] N'agba ochie Chukwu nyere nna anyị ha Manna, Jesu zụkwazịrị anyị nri, N'oriri kpeazụ mgbe O nyer' anyị ahụ ya, N'ọbara ya sị anyị rie nụ o, Maka onwe anyị na mmadụ niile, Maka ndụ anyị na mgbaghara njọ, Jesu bata bata, ekwel' ajọ onye bata. [VERSE 2] Ngị Jesu bụ ndụ anyị, O Jesu. Bata bia biri n'obi m na enwezuga gị, Ọ nweghị ihe fọdụrụ n'ime anyị, Nke gaabụ ihe nwerisi, Bata bata ekwel' ajọ onye bata. [SOPRANO SOLO] Obi m naeche gị O Jesu bata ba bata ba, Bata n'obi m bia biri Jesu m, Ekwel' ajọ onye bata. I bata na ndụ m, obi m daara m mba gaekuni ma kwụrụ, I bata na ndụ m, Jesu ajọ onye agbara, Ekwel' ajọ onye bata. I biri n'ime m, a ga m ebi n'ime gị, A ga m ebi be ndụ dị asọ, A ga m ebi be ndụ mara mma n'ihi na m na gị bụ otu, Jesu m bata ba bata ba biri n'obi m, Bata ba bata ba biri n'obi m.

Download the sheet music

BATA BIRI N'IME OBI M

BATA BIRI N'IME OBI M

By Gerald C. Ani
Staff & Solfa
Igbo
5 pages
0 Downloads
Communion Hymns Eucharistic songs Hymns
0 0

More lyrics you may want