Full Lyrics
TUTTI
Nne m gwara m na di bụ chi
Nna m gwara m na di bụ chi
Nwaanyị ọbụna bụ di ya nzi
Nde ji ụlọ bụ di
Di bụ mma, di bụ ugwu
CHORUS
Mgbatiọma
Kwerere
MOTHER (ALTO SOLO)
O nwa m e, Ene bịa r'ije gị
Ene nw'ọhịa, Ene nw'ọhịa
DAUGHTER (SOPRANO SOLO)
Ka m naachọ di n'agbọghọ m le
Ka m naachọ di n'agbọghọ m le
Ah e ajụ m Ene, jụ ya, jụ ya, jụ ya, jụ ya, jụchaa, chasia ya
MOTHER (ALTO SOLO)
Nwa m i juru Ene ma gịnị di?
DAUGHTER (SOPRANO SOLO)
Ene anaghị ele ka nja
MOTHER (ALTO SOLO)
O nwa m e, Eke bịa r'ije gị o
Eke nw'ọhịa, Eke nw'ọhịa
DAUGHTER (SOPRANO SOLO)
Nne e, ekwe m Eke
MOTHER (ALTO SOLO)
Nwa m i kwer' Eke ma gịnị di?
DAUGHTER (SOPRANO SOLO)
Eke a naama ka mma
MOTHER (ALTO SOLO)
Nwa m ị makw' Eke n'egbukwa mmadụ?
DAUGHTER (SOPRANO SOLO)
Ọ gbu m, ọ zọọ m
MOTHER (ALTO SOLO)
Nwa m ị makw' Eke n'ekegbu mmadụ?
DAUGHTER (SOPRANO SOLO)
Ọ ke m, ọ teghe m
MOTHER (ALTO SOLO)
Nwa m ị makw' Eke n'enokwa mmadụ?
DAUGHTER (SOPRANO SOLO)
Ọ no m, ọ gbọọ m
FATHER (BASS SOLO)
A na m aghọ di, nekwanụ Eke
Eke nw'ọhịa, Eke nw'ọhịa