Ihe Ukwu Mere by Anyiforo Bon. C — Lyrics

Anyiforo Bon. C Igbo Christmas Celebrations Hymns Solfa notation

Full Lyrics

Ịnụgo ihe ukwu mere n'ụwa? Bịa k'anyị je leere. Ihe ukwu mere n'ezie ezi naasị n'ọ dị k'ome l'eme, Bịanụ were anya gị leere. Asị na ndị mmụọziọ gbagoara ma ya. K'anyị jebe, k'anyị jebe nụ o, Leere ihe n'eme, ihe n'eme, Ihe n'eme n'obodo Judea. O mere, o mere n'obodo Judea, Ihe mere 'me. Mere ndị mmụọma, ndị mmụọma, Ndị mmụọma jie kwọ otito, Jie kwu kwọ otito naeto. Chukwu Alleluia, tobe nụ Chukwu, Ewo! Omezuwo nkwa ya, Ozi tegbo 'nye mgbapụta. Aha ya bụ Emmanuel, Onye mgbapụta Israel. Anyị ndị le ya, ike ọchịchị Niile dịkwa n'ọbụaka ya. Amụrụ ya n'ụlọ anụ, lekene lekene, Lekene, ihei tụ n'anya lene, Tụ n'anya, iheo niile ọ dị egwu. Ihe ukwu mere n'ụwa niile na, Eze ebube gbadara n'ụwa, ụwa, ụwa, K'ọ o were chọta, chọta, chọta ndị nke Ya funuo ha.

Download the sheet music

Ihe Ukwu Mere

Ihe Ukwu Mere

By Anyiforo Bon. C
Solfa
Igbo
5 pages
1 Downloads
Christmas Celebrations Hymns
0 0

More lyrics you may want