Full Lyrics
ANTIPHON
Ihe omimi Ih'ịtụnanya makana n'oriri nsọ mmadụ na Chukwu abụrụgo ofu.
O l'etu ag'esi wee kọwa mmekọrịta madụ na muọ nsọ? makana na ya bụ oriri eligwe n'ụwa abụgoro ofu;
Zin'el'igwe el'ụwa n'nlejọ ya zin'eligwe Onye g'akọwanwụ? Onye g'akọwanwụ Ihe omimi nke dị n'oriri nsọ?
CHORUS
Oriri nsọ, Oriri nsọ, Oriri nsọ nri ndị muọzi e nri ndị muọma n'eri. Mana Site n'amara Ọbụrụ nri mmadụ ọ dị'omimi Ọgbar'ụwa gharịị nri n'enye ndụ ebighiebi sọ dị'omimi Ọgbar'ụwa gharịị; amara pụrụ iche dị n'ime ya; ọ dị'omimi Ọgbar'ụwa gharịị eh
VERSE 1
Achịcha na mmanya abụrụgo 'che kachasị nsọ Site n'ekper'ụkọchukwu na uzi ike nke Muọnsọ ka anyị niile sekpuoro Kristi na ya bụ oriri nsọ ọ bụ ihe omimi dị'elu nakwa isinzukọ chukwu.
VERSE 2
Nn'ọma eh nri dị omimi nri ọgwụgwọ ndụ byoriri nsọ; ike diegwu lee ike ọgbụgba ndụ nk'eligwe n'ụwa niile ya dịzị n'oriri nsọ; sọ ma ndị n'amaghi amagaghị ghọta n'ezie Ọ bụ Kristi n'ahụ Ya; Kristi n'ọbara ya e Kristi n'ọnwe ya Kristi n'uju ya ma ndị n'amaghi amagaghị ghọta n'ezie; Ọ bụ ihe omimi dị n'ime omimi n'onwe ya Ihe omimi dị n'ime omini n'onye ya Ọ bụ ihe omimi IHE OMIMI nke dielu.