Ihe Chukwu Merem by Martins Asogwa & Obioha Ogbonna — Lyrics

Martins Asogwa & Obioha Ogbonna Igbo Offertory Hymns Recessional / Dismissal Hymns Celebrations Hymns Sacred songs Solfa notation

Full Lyrics

TENOR INTRO Bịanụ lee ihe Chukwu mere m, o bịa lee. CHORUS Iheoma Chukwu mere m o... Ihe Chukwu mere m, iheọma Chukwu mere m, Ihe Chukwu mere m, ọ nwe ihe Chukwu mere m, Bịa lee iheọma Chukwu mere m, Bịa lee nkọwa nmesọma ya n'ebe m nọ ọbara ụba e, Iheọma mere m, nkọwa nmesọma ya n'ebe m nọ ọbara ụba, ewo! Ọ nwe ihe Chukwu mere m, Bịanụ hụrụ iheọma o mere m, Chukwu kachasị ihe nile. VERSE 1 Ọ nyere m ndụ m o, ọ nyere m eganihu, Ọ nyere m akụnụba, o mere m m abụrụ eze, Chukwu bụ ọkaka mee, ọ bụ ọkaka, O kere ụwa nile karịrị akarị, Bịanụ hụrụ iheọma Chukwu mere m o, Ọ karịrị akarị, a karịrị akarị, oho, Ọ karịrị akarị, a karịrị akarị. VERSE 3 (BASS INTRO) Ọ nyere m akụnụba, o mere m m abụrụ eze. Ọ nyere m akụnụba, o mere m m abụrụ eze. TENOR SOLO Olisa do, Onye dị ka Chukwu, mmalite na ọgwụgwụ... CHOIR OSTINATO O mere m m abụrụ ọgaranya o, ọ nyere m akụnụba, O mere m m abụrụ ebighị ebi, ọ dịghị onye gba nwa, Ọkaka o, maka n'ihe ọma o nieme m o, A ga m atụrụ gị mma mma, Omeokachie, A ga m eburu ọgaranya o, o mere m m abụrụ ọgaranya o, O mere m m abụrụ eze. Ọ nyere m akụnụba, o mere m m abụrụ ebuli gị elu, Maka n'ị bụ dike, a ga m ebuli gị elu, Maka n'ị bụ dike, a ga m ebuli gị elu e, Ị bụ dike, a ga m ebuli gị elu ze. A ga m aja ya mma, kele ya Chukwu Nna, A ga m aja ya mma ọkaka, Ekene dịrị Chineke Onye kere ụwa nile, Ọtụtọ dịrị Chineke, ọ karịrị akarị, Chineke kere ụwa nile, Nna, A ga m aja ya mma, kele ya Chukwu Nna, Maka ọ nyere m akụnụgị, ị kachasị ihe nile, ewo! Buru ọgaranya o, o kere ụwa nile, ewo! Ba, o mere m m abụrụ eze, o kere ụwa nile, ewo! CODA Bịanụ lee! Bịanụ lee!! Nwa nne m, bịa nụ, Nwa nne m, bịa nụ, nu, lee! Okoro bịa nụ lee o! Bịanụ lee!!! Bịanụ lee! Onye kachasị ihe nile. Lee, bịanụ lee! Onye kachasị ihe nile. Lee, bịanụ lee! Onye kachasị ihe nile.

Download the sheet music

Ihe Chukwu Merem

Ihe Chukwu Merem

By Martins Asogwa & Obioh...
Solfa
Igbo
3 pages
47 Downloads
Offertory Hymns Recessional / Dismissal Hymns Celebrations Hymns Sacred songs
3 0

More lyrics you may want