Full Lyrics
VERSE 1
Ọ dighi ọnụ nke pụrụ ikọ
Ahụhụ nile nke Jisus hụrụ n'ihim
Ọ dighi kwa nne, Ọ dighi nn'ọzọ
Pụrụ ime kwa dika Jisus merem.
VERSE 2
N'eti ok'ọhia na ndagwụrugwu,
N'okpuru oke nkwume, n'ọgba n'el'ugwu;
N'ok'ọchichiri na miri ozuzo,
Onye m'ọ bugh m'onwem ka Jisus nachọ?
VERSE 3
Obubu ọnụ, ọbubu asọ,
Na ih'otiti na nkọcha, na okpu ogwu;
Ọkụkụ aka, ya na igb'ọtọ,
Ha dum Ọ bu mu onwem ka Jisus hụrụ.
VERSE 4
Kam chot'Onyenwem, kam jekwuru Ya:
Ka nkpuru obim keta kw'izu ike n'udo;
Kam nye kwa Y'onwem, ma ụkwụ m'aka,
Onye kam diri m'o bugh Gi Ez'udo.
CHORUS
Ọnwụ kasi njọ n'ụwa b'ọnwụ nk'obe; n'ụwa:
Ibu kasi arọ n'ụwa b'ibu nke njọ n'ụwa
Ọnwụ kasi njọ na Ibu kasi arọ bu
ihe kasi njọ n'ọgbọ ka Jisus bụrụ n'ihim.