Bianu Ndi Enyim Nile by Harcourt Whyte — Lyrics

Harcourt Whyte Igbo Entrance songs Hymns Staff & Solfa notation

Full Lyrics

VERSE 1 Bianu ndi enyim nile: Bianu umu Chineke; Bia, k'ay' nile wer'otu olu di elu to Chineke anyi. Ọ bu ya kere madu, Me kwa y'isi nk'okike; Ya bu k'anyi nile were obi zur'oke to Chukwu. Biko, wer'ọṅu tonu Chukwu, tonu Chukwu, tonu Chukwu; biko wer'ọṅu tonu Chukwu, si, Jehova bu Chukwu n'ezie. CHORUS N'ezie, n'ezie, n'ezie, n'ezie. Biko, wer'ọṅu tonu Chukwu, si, Jehova bu Chukwu n'ezie. VERSE 2 Chineke kere uwa Nara otuto umu I Nke ha ji obi nk'ekele Naeto n'ebe a, n'ebe nile; Ọ bu I nwe otuto anyi, Ngọzi Gi bu kwa nk'anyi; Nkpa na nsogbu nile nk'obi Gi gaegbopur'ay'ha nile. Biko wer'ọṅu janu Chukwu, Janu Chukwu, janu Chukwu; Biko wer'ọṅu janu Chukwu, Si, Jehova bu Chukwu n'ezie. VERSE 3 Otuto na nsọpuru Diri Ez'anyi Jisus; Nke ji ọbara di ok'ọnu Gbaput'anyi n'ugwu Kalvari. I bu Nwa nke Jehova, Buru kwa nwa nke Meri; Nwa nke Chukwu, Nwa nke madu, Otuto nile diri Gi. Biko wer'ọṅu fenu Chukwu, fenu Chukwu, fenu Chukwu; Biko wer'ọṅu fenu Chukwu, Si, Jehova bu Chukwu n'ezie.

Download the sheet music

Bianu Ndi Enyim Nile

Bianu Ndi Enyim Nile

By Harcourt Whyte
Staff & Solfa
Igbo
2 pages
11 Downloads
Entrance songs Hymns
0 0

More lyrics you may want