Onye Uche Gbagor'agbago by Ikoli Harcourt Whyte — Lyrics

Ikoli Harcourt Whyte Igbo Hymns Anthems Staff & Solfa notation

Full Lyrics

VERSE 1 Madu, onye nk'uche kọrọ, Bu onyuche gbagor'agbago, N'asi, na Chukw'a digh, eligw'adighi kwa Ofufe nke Chukwu bukwa ih'efu. Mmadu n'etu fu oge, n'etu fu kwa aku N'eme kwa ka ndi n'ekpere Chi. CHORUS Eligwe na eluwa, An'ufe nk'igwe m'anu ọhia Ndi niile ndi bi n'uwa onye bu kw'onye kere ha? Ewo, Gi onye uche gbagor'agbago, Gi onye uche gbagor'agbago. VERSE 2 Gaa, gi bu onye nke n'enweghi uche, Na akuku nk'oke osimiri, H'umu azu di uku, ma ndi di nta nile, Na ihe nke di n'ururọ di n'iyi Olebe ka ha si, gini ka ha g'aghọ Gi onyuche gbagor'agbago? VERSE 3 Leda anya gi na mbara nke ala, Leli kwa anya gi na mbara nk'igwe N'elu gini k'ọnọ gi ni bu ihe ji ha? Ikuku n'eku n'abali n'ehihie Olemgbe k'ọnagwu, olemgbe k'ọn'akọ Gi onyuche gbagor'agbago? VERSE 4 Usu niile bu nke dikwa na igwe, Uwa na ihe niile bu nke di ya Bu kwa ọlu aka nke Chukwu nke igwe; Anyi bu madu bu kwa umu nke ya Ya bu ezi umu nnam, ejeso kwa l'onye Nke uche ya gbarọr'agbago.

Download the sheet music

Onye Uche Gbagor'agbago

Onye Uche Gbagor'agbago

By Ikoli Harcourt Whyte
Staff & Solfa
Igbo
2 pages
5 Downloads
Hymns Anthems
0 0

More lyrics you may want