Full Lyrics
CHORUS
Alleluia Ọ biliwo, Ọ biliwo,
Jesu a kpọgburu n'elu obe Onye mmeri.
Alleluia Ọ biliwo, h'ezie Ọ biliwo,
Jesu a kpọgburu n'elu obe Onye mmeri.
VERSE 1
N'ụtụtụ tụ ka ụmụ nwaanyị jere n'ili te ude n'ahụ Jesu.
Mụọma si n'igwe gbadata n'ili wee sị ha na Ọ biliwo.
VERSE 2
Mary n'ebe akwa n'achọ ahụ Jesu,
Mary n'eti mkpu n'ili Jesu.
Mary n'akwụgharị ebe n'ili Jesu,
Mgbe Ọ zutere Dinwenu.
Mary emetụkwam aka maka n'ihi na akarom wee jekwu Nna m o,
Gwabazi ezi ụmụnna m ka ha gaba na Galilee.
Ebe ahụ ka M ga nọ gosi onwe m.