Full Lyrics
REFRAIN
Gaabanụ na mba nile gaa gbasab' oziọma, n'aja missa gwụsịgo.
Ụmụ Chineke k'anyị gaa n'ụwa kwusab' oziọma nke Chineke.
VERSE 1
Site n'oziọma anyị nụrụ Kristi ekenye g'anyị ọlụ nke ịgbasa ozi, oziọma nk'ịhụnanya ya n'eluwa nile.
VERSE 2
K'anyị site n'eziokwu anyị na ezigbo omume anyị gbasab' oziọma, k'anyị gaa n'ebe anyị n'alụ ọlụ, ebe anyị n'azụ ahịa, na n'ebe obibi anyị kwusab' oziọma nke Chukwu.
VERSE 3
Ekele dịrị gị Chineke Onye mere k'anyị sonye n'aja missa dị asọ, ekele oh k'anyị n'enye Chukwu Nna, Chukwu Nwa na Chukwu Mmụọ Nsọ atọ n'otu dị ngọzi, otito dịrị ha ebighebi.