Full Lyrics
Tenor/Soprano solo (Mbem)
Aye o! Aye o! Aye o! Aye o!
Ndi nne na ndi nna putaba
Okoro bia n'agboghobia putaba
Umuaka ndi nta kiri putaba
Maka na oge anyi ji enwe anuri erugo
Oge anyi ji egwuri egwu
Oge anyi ji akupari nkata erugo
Egwu onwa
Chorus
Onye obula putaba, putanu maka egwu onwa
O g'egwuregwu oge anyi ji enwe anuri
Icho nkata anyi akpariba
Icho akuko anyi akoriba
O g'egwuregwu oge anyi ji enwe anuri
Ku oronu nwa ngwere aka, erente pipi!
Ku oronu nwa ngwere aka, erente nwa ngwere gara ije n'o gbara oso
Erente pipi! Erente nwa ngwere gara ije n'o gbara oso
Erente pipi! Erente pipi! Erente hei!
Ku oronu nwa ngwere aka, erente pipi!
Ku oronu nwa ngwere aka, erente pipi!
Kwam jigi jigi kwam jigi, obi n'ato yuto
Gbe ote ngwo n'ete ngwo ya, obi n'ato yuto
Gbe ote ngwo n'ete ngwo ya, obi n'ato yuto
Gbe origoro n'elu ya, mgbe oridara n'ete ya
Kwam jigi jigi kwam jigi, obi n'ato yuto
Kwam jigi jigi kwam jigi, obi n'ato yuto
Okere okereke, du du du ya ya!
Okere okereke, du du du ya ya!
Okere okereke, du du du ya ya!
Okere okereke, du du du ya ya!
Kwe n'oga n'aga, o ga n'aga
Kwe n'oga n'aga, o ga n'aga
Ije onye n'ako, ede! Ete mara mma
Okuko onye n'ako, ede! Ete mara mma
Okeke n'ako eko, ede! Ete mara mma
Okafo n'ako, ede! Ete mara mma
Okuko mgbeke n'ako, ede! Ete mara mma
Nwamgbafor n'ako, ede! Ete mara mma
Okuko onye ele n'anya n'azu
Mmawu anyi n'aga n'azu
Onye ele n'anya n'azu
Mmawu anyi g'apia yi ihe
Onye lee anya n'azu
Mmawu anyi g'apia yi ihe
Onye lee anya n'azu
Tu zam zam tu zam zam
Nwa nnunu nwa nnunu nta
Tu zam zam tu zam zam
Nwa nnunu nwa nnunu nta
Tu zam zam tu zam zam
Ino ebe ahu e me gini?
A na m aturu nnem ose
Tukena ka i si atu
Tuu tuu tuu tuu
Tu nwoke n'ike n'ike
Tu nwoke n'ike n'ike
Onya mmiri pipiro
Piro piro ro
Pi ogene ge
Kpukpumkpo gene, ogene ogene ge
Kpukpumkpo gene, ogene ogene ge
Onye n'akp'ogene, ogene ogene ge
Kpuu kpuu, ogene ogene ge
Kpakpa nkolo kpan kolo
Udu mo ogene
Udu mo ogene
Onye omara
Dudu yaya, ya dudu yaay ya
Onye omara, onye omara
Kpakpa nkolo kpan kolo
Mara, onye omara
Kpakpa nkolo kpan kolo
Dudu yaya ya, dudu
Ya dudu yaya ya
Onye omara dudu yaya
Onye omara dudu yaya
Ya dudu yaya ya
Dudu yaay ya, dudu, ya!
Anyi jere be Obinna
Rie raisan bins
Onyi nuru fiftin botulus
Emeka g'achu oso
Anyi jere be Obinna, ewo!
Rie raisan bins
Onyi nuru fiftin botulus
Emeka g'achu oso
Turu bom turu bom bas kalaba
Laba laba kai kai!
Ewu n'eri ji di oku
Mbala n'eri ete biko
Megheere m uzo ka m bata onuku
Kedu onye g'abu oyimo?
Kedu onye g'abu oyimo?
Kedu onye g'abu oyim o?
M nye g'abu oyi mo
Afugo m oyi mo?
Afugo m oyi mo?
Afugo m oyi m o?
M nye g'abu oyi mo
Onye g'agba egwu iya?
G'agba egwu iya?
Onye g'agba egwu iya?
G'agba egwu o
N'eme ihere umu agb'obia
N'eme ihere umu okorobia
I g'agba egwu, i g'agba egwu
I g'agba egwu ewo!
Ekwensu hapu ya ka o laa, ka o laa be di
Ya ajo mmuo hapu ya ka o laa, ka o laa be di
Ya i g'agba egwu, i g'agba egwu
I g'agba egwu ewo!
I g'agba egwu, i g'agba egwu
I g'agba egwu ewo!
Onye ihem n'ewe iwe, ya biko wegbuo ya
Kpamkpam! Osuko su nwa mkpi ya biko sugbuo yo
Kpamkpam! Onye ihem n'ewe iwe
Onye ihem n'ewe iwe
Onye ihem n'ewe iwe, ya biko wegbuo ya
Kpamkpam!