Full Lyrics
[STORYTELLER]
O nwer' akụkọ m gaakọr' ụnụ,
O nwer' akụkọ m gaakọr' ụnụ, eh!
Akụkọ a mere na b'anyị,
Akụkọ mere n'obodo Amarigumo,
Na b'Eze n'obi eze,
Akụkọ mere m mat' ife,
Akụkọ mere m ka anya,
Akụkọ mere m chegharịa,
Sị f'ife m'eri ụnụ a naege ntị?
[PEOPLE]
Kọọr' anyị k'obi dị anyị mma,
M'ọ dị mma m'ọ dị njọ, anyị gaege li,
Akụkọ gị naadị anyị mma,
Biko nyen' anyị akụkọ,
Tumangwe, tumangwe, tumangwe, tumangwe.
[STORYTELLER]
Eze Okorafor b'Eze Amarigumo,
Ọ lụg' Obidiya kemgbe mgbe n'ise,
Atụghụ atụ nke ji amụ amụ,
Ndị obodo etie!
Eze j'emuo r'anyị,
Ụmụnna wee baa!
Ka ụmụ ibe wee baa!
Ndị ọgọ wee baa!
Mana ha bikwa n'udo.
[PEOPLE]
O nwer' akụkọ m g'akọr' ụnụ, eh!
Akụkọ a mere na b'anyị,
Sị f'ife ụnụ a naege ntị?
Kọọr' anyị k'obi dị anyị mma,
M'ọ dị mma m'ọ dị njọ, anyị gaege li,
Akụkọ gị naadị anyị mma,
Biko nyen' anyị akụkọ,
Tumangwe, tumangwe, tumangwe, tumangwe.
[STORYTELLER]
Adakụ, nwata mara mma,
Adakụ bụ nwata bụ sọ mma,
Ọ mara mma nile ọ mara,
Mana agwa ya jọrọ njọ,
Ọ mara mma nile ọ mara,
Mana agwa ya naasọ oyi,
Gwa Adakụ fuokwu,
Ọ gbaka shi b'ọnụ,
Ọ gbaka shi b'ahụ,
Ọ gbaka shi b'anya,
Ya ndụmọdụ, k'Eze lusiri ya,
Gosiri onwe ya,
Kedu ih' Eze gaeme ebegbu n'Adakụ duzi ime,
Ewo Obidiya arịrị egbuo gị o.
[PEOPLE]
Ajọ obi ajọka kwa,
Ajọ omume ajọka,
Nganga ajọka njọ,
Biko zeere ha,
Mechara buru n'obi,
Iya dizi ime,
K'Adakụ naamụcha Obidiya wee mụgwa ya,
Ewo Ayaya o,
Turu gem gem, turu gem gem,
Turu gem gem, turu gem gem,
Tumangwe, tumangwe, tumangwe, tumangwe.
[STORYTELLER]
Ajọ obi ajọka kwa,
Ajọ omume ajọka,
Nganga ajọka njọ,
Biko zeere ya,
Ka chi n'efo, ka ha n'eto,
Obidiya ziri nwa ya ụzọ ụmwala,
Mana Adakụ zaliferi nwa ya n'ụzọ (ọrọ njọ),
Zabie nwa ya nke n'oweghị nsọ puru ma ncha,
N'ezie ihe agwọ mụrụ aghaghị ịdị ka agwọ.
[PEOPLE]
Ajọ obi ajọka kwa,
Ajọ omume ajọka njọ,
Nganga ajọka njọ,
Biko zeere ha,
Ewo ayaya o,
Turu gem gem, turu gem gem,
Turu gem gem, turu gem gem.
[STORYTELLER]
Otu ụbọchị eruo o, n'obi Eze,
Adakụ na nwa ya nọ n'ezi eri nri,
Otu nwoke ike gwụworo agụụ ji,
Wee kwute ha n'ezi yọọ ha nyetunu ya k'orie,
Agụụ naagụ m o, biko nyetunu m kam rie,
Ike gwụrụ m o, akpịrị naakpọ m nkụ,
Nw'ogbenye naarịọ,
Man' Adakụ buru mmiri kwaa ya n'ahụ,
Ewo ayaya o,
K'Obidiya nụrụ ihe mere obi agbawa ya,
K'Obidiya nụrụ ajọ omume nwunye di ya owute ya,
Wee zie nwa ya ya gaa kpọta nwokaa ahụ.
[STORYTELLER]
Ka chi n'eji, ka chi n'efo,
K'ụbọchị naaga,
Otu ụbọchị eruo, Eze Okorafor wee kpọọ ndị be ya zu n'obi ya,
N'onwer' otu nwoke bịarị k'ọ nụbi ya,
Ọ bụ mmanya ka ọ gbur' akwụ,
Chara n'isi ụlọ ya n'ọbụ Okpara Eze Amagunze ezi enyi ya,
Nwoke mara mma, nwoke dị ike ọrụ, nwoke nwer' amamihe,
Okpara Eze n'Amagunze, ọ bịara na be ya,
Ka ọ lụrụ ofu nwa ya.
[ADAKU]
Adakụ etie!
Ihe nwam lụba nụ o!
Ihe nwam lụba nụ o!
Ihe nwam lụba nụ o!
Obi ndo me b'ọnụ,
Ọ bụ sọ mma ọ bụ ya b'Adaeze,
Ọ bụ sọ mma ọ bụ ya b'Adaeze,
Nwa mara mma, ya b'Adaeze.
[STORYTELLER]
Onye amaghị ebe mmiri si bido maba ya,
Agaghị ama kwa ebe ya bụ mmiri g'akwụsị,
Onye zoro nsị, jisi eso be ya,
Onye kpara nkụ ahụhụ ngwer' abịara y'ọrụ,
Mkpur' onye kụrụ n'ụwa, k'ọ g'aawọrọ,
Onye mezie ihe, ọ nwet' ụgwọ ezi ihe,
K'Adakụ naamachagharị ebe un'eme ọnụ,
Okpara Eze wee jụọ,
Okpara Eze wee jụọ,
Ọ kwụ ị chaze gọ?
Ọ kwụ ị chaze gọ?
A rịọrọ m gị nri ị bu ọ m'asọ n'ahụ o,
A rịọrọ m gị mmiri ị wụọ m mmiri n'ahụ o,
Sị n'awa m ị ma amụla kam bebe,
Sị n'awa m ị ma amụla kam bebe,
Adakụ ị ma amụla kam bebe.