Missa Ekele Eze M N'adi Ndu by Benedict Paschal — Lyrics

Benedict Paschal Igbo Entrance songs Offertory Hymns Recessional / Dismissal Hymns Hymns Solfa notation

Full Lyrics

CHORUS Eze m n'adị ndụ, Eze m n'adị ndụ, Onye nwe anyị n'adị ndụ, n'ime ọnọdụ m niile, Eze m n'adị ndụ. VERSE 1 Nna anyị na mbụ, chunyere gị aja ekele, maka ihe ọma ị naemere anyị. Site n'afọ wee ruo na taa, Nara ekele anyị o ezi Nna, nara otito, Nna nara onyinye anyị o, anyị n'ebunye gị, maka n'Eze anyị n'adị ndụ. Eze m n'adị ndụ. VERSE 2 Chukwu Okike igwe, Dike gị naerubere gị isi, ihe niile ị kere, ha niile dịkwa sọ mma. Mmadụ ị kere, ị kere ya n'oyiyi gị, maka n'ịhụnanya ị nwere n'ebe anyị nọ, maka n'Eze anyị n'adị ndụ. Eze m n'adị ndụ. VERSE 3 Mgbe anyị nọ n'afọ, amara gị n'echekwa anyị, mgbe anyị pụtaru ụwa, amara gị n'echekwa anyị, site n'oge ahụ, amara gị n'onyere anyị, n'eziokwu amara gị bara anyị ụba, maka n'Eze anyị n'adị ndụ. Eze m n'adị ndụ. VERSE 4 Chukwu bi n'igwe, Onye kere ụwa niile, gị bụ Chikanze n'ọzọ a gaadaghị, Chipụzọ, gị bụ ọdụm ebo Juda, gị bụ dike n'idi kere ere, gị bụ odogwu akataaka, gị bụ oji ọkụ eria aja, Chukwu ka dibịa niile, Chukwu ka chukwu niile, ekele dịkwara gị, otito dịkwara gị, ngọzi dịkwara gị, ebube dịkwara gị, nara otito. Eze anyị n'adị ndụ. Eze m n'adị ndụ.

Download the sheet music

Missa Ekele Eze M N'adi Ndu

Missa Ekele Eze M N'adi Ndu

By Benedict Paschal
Solfa
Igbo
4 pages
0 Downloads
Entrance songs Offertory Hymns Recessional / Dismissal Hymns Hymns
0 0

More lyrics you may want