Full Lyrics
REFRAIN
Ihakuko emeelanuo! Ony'obula gbab'egwu!!
Uwa nile golibe nuo n'amulu eze uwa nile.
Kristi abiago, amulu ya n'ul'anu na Bethlehem Judea!
K'anyi jeenu, k'anyi jeenu kelee eze uwa nile,
Kristi mo, eze amulu ohuru.
Lee ka enibere ya n'agbuke,
Lee Maria ka o ku nwa ohuru ya, okpar'eze n'udo.
Emmanuel, Ony'ukwu onye nzoput'anyi.
VERSE 2
Kpakpando n'amuke, kpakpando n'amuke, ke, ke, ke.
O n'egosi uwa eb'ahu a mulu Jesu.
Ndi nch'atulu ji eso na ije, gbagaba n'ul'anu oge ha nuru ozi.
Ndi Eze ato si n'owuw'anyanwu bia, ha n'acho Jesu.
Ha chotara ya n'ihi na kpakpando n'amuke, ke, ke.
VERSE 3
Ndi muo zidoo, kweben' ukwe aṅụrị,
Kwer' ozi udo, wedata rue bube Chineke n'imobi ndi mmadu.
Kwebenu udo, udo n'ime mmadu ndi ihe ha n'aso Chukwu.