GORIBENU by IZU MARCEL ONYEOCHA — Lyrics

IZU MARCEL ONYEOCHA Igbo Easter Hymns Holy Week Hymns Hymns Staff & Solfa notation

Full Lyrics

Ike nile nke eligwe ṅụrịwanụ! Igwe ndị mmụọ ma nile kweben'ukwe! Goriwenụ, ihe okike nile nụrụ bọrọ ukpu eze Chineke! Jesu Kristi Eze anyị ebilitego! Ghabenụ opi nke nzọpụta. Ụwa, ṅụrịa n'eki ihe amụke amụke, were ihe nke unye Eze gị chawapụta! Kristi emerigo! Ebube ejupụtala n'ime gị Ọchịchịrị enwekwaghị ọnọdụ n'ụwa! Nne dị asọ bụ Ụka ṅụrịwa, Nụ ego li n'otito. Nyabụ Onye Nzọpụta nụ bilitere n'ọnwụ n'achakwa sị gị! Ka'ebe a nile jupụta na ụzụ aṅụrị, na aza ghachi nnukwu abụ ndị nke Chineke nile! Ndị enyịm ọma, mụ na ha guzo n'ihe a dị asọ soronụ m n'ịrịọ Chineke ebere ka O nye nwaodibo ya na ekwesịghị ekwesị grasia iji kwenkwe'otito Paska Ya Onyenwe'anyị nọnyere'ụnụ. Nọnyere kwa gị. Welite nụ'obi elu. Anyị'ewelite ha n'ebe Dinwenụ nọ. K'anyị nyenụ Dinwenụ Chukwu anyị ekele O kwesịrị ka ihe ziri ezi. O kwesịrị'nnọ k'anyị we're'obi'anyị nile mkpụrụ'obi'anyị nile na ulu anyị nile natọ Chineke n'anaghị ahụ'anya, Nna ji ike nile, na so otu Nwa ya Di nwenụ'anyị Jesu Kristi. Maka na Kristi ejirila ọbara ya gba'aanyị kwụchitere anyị ụgwọ njọ Adam n'aka Nna dị ọwatọwa. Ihe a bụ emume ngafega anyị, mgbe e ji egbu Kristi ezigbo Nwatụrụ nke ọbara ya naedo ụlọ ndị nile kwerenụ asọ. Ihe a bụ'uchichi nụ mgbe ị zọpụtasịrị Nna'anyị ha isi ri n'ọbụnbụ tọhapụ ụmụ Isrel duru ha, ụkwụ kọrọ kọrọ ha kufeere osimiri. Ihe a bụ'uchichi nụ mgbe ị de ọkụ kpọsara ọchịchịrị nke njọ. Ihe a bụ anyasị nụ, mgbe ọma a gbachịpụ njọ ndị ụmụ Kristi nụ n'ebe nile, zọpụta ha na mmetọ nile, kpọbatakwa ha n'ọkwa grasia ọnọdụ ha na abawanye n'adịm asọ. Ihe a bụ'ọchịchị nụ, mgbe Jesu Kristi dọbiri udo igwe nke ọnwụ si n'ili bilite n'obube. Gịnị bụ uru ndụ gaara ịbara'anyị ma a sị na Kristi abịaghị bụrụ onye nzọpụta anyị. Nna, anya ị naeleta anyị adịkakwanụ egwu! Ka nnukwu amara gị si karịa nchịkọta nani maka iji gbapụta nwaohu ka ijiri banye Nwa Gị. O mmehie ihu ọma ọ njọ dị mkpa nụ Adam mehiera, nke ritere anyị nnukwu onye'mgbapụta dị otu a! Ụchịchị dị ngọzị karịcha ihe ya, Chineke hụrọ ya ịhụ na Kristi si na'ndị nwụrọ'ọnwụ naekulite! Akwụkwọ'nsọ kwuru banyere uchichi a sị: "Uchichi gaefo dịka chi: Ọ gaabụ ihe m na aṅụlị m. Ike nke uchichi a d'asọ n'achụsasị ajọ ihe nile naa sachapụ arụ'mmehie, naeweghachite amaghị aghụghọ, naewetara ndị nụ n'uju aṅụrị; ọ naewepụ akpọmasị, na ewetara anyị udo, na emeda ngala nke ụwa a. Ọ bụ uchichi a nụ gọziri'nnụ n'ezie mgbe eligwe na ala jikọrọ akụgbaa akwụkwọ, a bjakwa dozie agbata Chineke na mmadụ. Ya bụ, Nna'nke eligwe, n'ime aṅụrị nke uchichi a, nabata aja otito anyị na ehunyere gị n'anyasị a, ọ bụ onyinye pụrụ iche nke Ụka Gị. Nara ọkụ Pascha nke a, ọbụ irọ'ọkụ ke wara eke wa mana ọ danyụghị adanyụ, ọ bụ ide ọkụ n'ebike na asọpụrụ'nke Chineke Ka ya na ọkụ nke eligwe gbagwaa n'ọnwụ n'ilo n'ike, Kpọsịa ọchịchịrị nke uchichi a! Ka kpakpando Ụtụtụ na enweghị ọdịda kwụdụ irọ'ọkụ aka ọ na enwu: kpakpando Ụtụtụ ahụ bụ Kristi, onye siri na'ndị nwụrọ'ọnwụ pụtakwa ọzọ bjakwa chakwasị ụwa nile ihe udo ya, Nwa gị Onye dị adụ na achị ebe ebelie. Amen.

Download the sheet music

GORIBENU

GORIBENU

By IZU MARCEL ONYEOCHA
Staff & Solfa
Igbo
4 pages
0 Downloads
Easter Hymns Holy Week Hymns Hymns
0 0

More lyrics you may want