Full Lyrics
VERSE 1
Etum k'anyi bu,
Ahu anyi bu aja,
Mkpur'obi anyi g'eje n'ihu Chukwu ka ekpee ya ikpe.
Biko Eze bi n'igwe, Chineke mee ebere,
Biko Eze bi n'igwe, Onye nwem mee ebere.
Mmadu kwusi, keleri nwa oge, chee chiche,
Juo onwe gi ihe i bu.
VERSE 2
Leenu k'onye nwur'anwu si togboro nu,
Ma n'ututu k'odi ndu a na etu ya Odogwu,
Ome mgbo'ji, Agu, dike nwanne m,
Dike nozi n'ihu Onye ikpe.
VERSE 3
Leenu nnukwu mmadu n'uwa,
K'o buzi ihe nkiti,
Nri ahuhu.
VERSE 4
Ihe mmadu emela n'uwa,
O gaghia gbanahu onwu,
I ga aza riri ajuju n'ihu Chukwu.
VERSE 5
Onye nwe anyi,
I maara n'anyi adighi ike,
Meere anyi ebere.