Full Lyrics
REFRAIN
Onye bụ eze nke ebube,
Onye bụ eze nke ebube,
Ọ bụ onye nwe anyị.
Nabatanụ ya,
Mehee obi gị nwanne m ka ọ bata,
Kwadooro ya ọnọdụ na ndụ gị,
N'ihi n'ọ bụ onye kere gị.
VERSE 1
Ọnụ ụzọ ama bulienụ isi ụnụ elu,
Ọnụ ụzọ okpu litenụ elu,
Litenụ, lite, lite, litelu,
Ka eze dị ebube wee bata.
VERSE 2
Onye bụ eze ebube a, onye nwe anyị,
Dike, Dike, Dike,
Onye nwe anyị bụ Dike ọgụ n'agha.
VERSE 3
Onye bụ eze ebube a, Onye bụ eze karịa
Dinwenu nk'igwe ndị agha,
Dinwenu nk'igwe ndị agha,
Ọ bụ ya bụ eze ebube.