N’AJA MISSA DỊ ASỌ by Fr. Bart C. Ezeokafor — Lyrics

Fr. Bart C. Ezeokafor Igbo Entrance songs Hymns Solfa notation

Full Lyrics

REFRAIN Chukwu lekwa ndị Gị o! Leekw'anyị o! Chukwu lekwa ndị Gị anyị abịa n'obi. I nye Gị ekele k'anyị kele, nye Gị ekele kelee Gị mak' ọgọ Gị nile, I nye Gị otito n'ofufe kwesịrị Gị. Kọkwaara Gị mkpa anyị, rịọ Gị mgbaghara n'Aja Missa, k'anyị kọkwaara Gị mkpa anyị, rịọ Gị mgbaghara n'Aja Missa dị asọ. VERSE 1 Añụrị jurụ m'obi, mgbe m nụrụ ka ha kwuru sị: "K'anyị je n'ụlọ nsọ n'ụlọ nsọ Chineke" Chukwu eh lee mo! abịara m n'ihu Gị I nye Gị ekele. VERSE 2 Ugo nile ebelusịgo I nye Gị ekele ụmụnnụnụ nk'igwe, anụ bi n'ọhịa ọnwa na kpakpando na ihe nile I ker' eke anyị guzooro n'ihu Gị I nye Gị ekele. VERSE 3 Lee ka ụlọ obibi Gị siri makarịsịa mma! N'ezie ha bụ ndị a gọziri agọzi bụ ndị bi n'ụlọ Gị naekwere Gị ukwe otito oge nile. Oh! Ọ gaamasị m isoro ha kwebere Gị'ukwe ọñụ I nye Gị ekele. VERSE 4 O t'ụbọchị na be Gị ka mma Karịa nnụkwuru nnụ afọ n'ebe ọzọ! Chukwu eh! abịara m n'obi Gị I nye Gị ekele.

Download the sheet music

N’AJA MISSA DỊ ASỌ

N’AJA MISSA DỊ ASỌ

By Fr. Bart C. Ezeokafor
Solfa
Igbo
2 pages
4 Downloads
Entrance songs Hymns
0 0

More lyrics you may want