Full Lyrics
REFRAIN
Lee, ndị agọziri agọzi ezukọla
Mba dị nsọ
Anyị bụ ndị a họtara abịawo,
K'anyị fee Chineke
N'aja Missa dị asọ.
VERSE 1
Anyị bụ ihe nketa n'ezie
Ndị Chineke họtara onwe ya
Lee k'anyị ji bịa
Nye ya nsọpụrụ kacha elu.
VERSE 2
Obi ebere gị eruwo m n'aka
Anyị bụ ndị nke gị
Agbụrụ a họtara abịawo
K'anyị fee gị.
VERSE 3
Imela k'anyị bụrụ agbụrụ ndị eze
Oh Dinwenu meenụ k'aja anyị nsọ n'ezie.
VERSE 4
Nye ya ekene
Ya kere ihe nile
Ị tosiri Onye nwe anyị
K'anyị nye gị ekene n'otito.