ANYI EZUKOTALA by Andrew Emeka Chukwu — Lyrics

Andrew Emeka Chukwu Igbo Entrance songs Celebrations Easter Hymns Solfa notation

Full Lyrics

[REFRAIN] Umu gi e zukotala o n'obi gi eze, anyi biara k'anyi kele gi maka n'idiri anyi mma o. [VERSE 1] Onu a i nyerem o kam jiri bia, e jim ya bia kam guoro gi egwu n'obi gi. O gaghi eme m n'onu i buru gi abu otito. Biko gbadata bia gbaba egwu oma m jiri bia. [VERSE 2] Ndu n'ahu ike i nyerem o n'ato m uto kariri mmanu anu. Aku n'uba i nyerem o n'ato m rikpo. Ogugu a si na mma ichorom atogbugo m o Chukwu okike. [VERSE 3] Ke oginizi kam geji gbub'oge ibiatuorogi mmamma. Umu gi ndi keren'oyiye gi n'ekele gi o. Maka n'eke sidi ka nanka mere k'adiy'i m'ozo. Nke mere m e di anyi mma Olisa bin'igwe. Anyi choro ozo o Nna doo mere gaba n'iru. [VERSE 4] K'iru anyi di iche iche biko n'k'anyi siri di iche iche, anyi eburu uwa nke anyi nile tinye gi n'aka. O Chukwu biko Chukwu nuru olu anyi o, ma meere anyi ihe anyi n'ario gi k'osi akpa anyi.

Download the sheet music

ANYI EZUKOTALA

ANYI EZUKOTALA

By Andrew Emeka Chukwu
Solfa
Igbo
2 pages
33 Downloads
Entrance songs Celebrations Easter Hymns
0 0

More lyrics you may want