Full Lyrics
INTRO
Otu m ele si achọ mmiri ọ gaañụ,
Ka obi m si achọ Gị, O Chineke.
CHORUS
Añụrịrị m o, oge m nụrụ ha kwuru sị,
Ngwanụ k'anyị jee n'obi Chineke,
K'anyị jee n'obi Chineke,
K'anyị jee n'ụlọ nsọ, O Chineke.
VERSE 1
Etu nnụnụ elelebe si achọtar' onwe ya ebe obibi,
Eb'ọ g'edote nwa ya n'akụkụ ebe nchụaja Gị,
Ka o s'amasị m o ịbata n'obi Gị.
VERSE 2
Ha bụ ndị di ngọzi bụ ndị bi n'ụlọ Gị,
Naekwere Gị ukwe otito oge niile.
Ha bụ ndị di ngọzi bụ ndị bi n'ụlọ Gị,
Ndị ike ha dị na Gị.
VERSE 3
Otu ụbọchị n'obi Gị kachasị m mma,
Karịa nnu kwuru nnu n'ebe ọzọ.
Otu ụbọchị n'obi Gị kachasị m mma,
Karịa ibi n'ebe obibi ndị ajọ mmadụ.
VERSE 4 (CANTORS)
K'anyị jee n'ụlọ Chineke,
K'anyị jee n'ụlọ Chukwu,
Ebe ihu ebube eze ya si abịa.
Ọ bụ ebe ndụ,
Ọ bụ ebe udo n'ịhụnanya dị,
Ọ bụ ebe a naegbo mkpa,
Ọ bụ ebe a naaza ekpere.
Ngwanụ k'anyị jee, k'anyị jee o n'ụlọ Chukwu,
Ngwanụ k'anyị jee, añụrịrị m o, añụrịrị m o, k'anyị jee.