Full Lyrics
CHORUS
K'anyi jee, k'anyi jee, k'anyi jee nụ na Bethlehem.
K'anyi jee nụ n'ụlọ anụ.
K'anyi jee leta nwa ọhụrụ, eze keruwa niile.
Ụwa ṅụrịba nụ o,
Ụwa gọribe nụ o,
Na amụgọ nwa ka nwa,
Emmanuel Onye nzọpụta.
VERSE 1
Amụma amara maka ọmụmụ onye eze emezugo nụ o.
N'ọnụ Onye amụma Isaiah,
Aga akpọ ya Emmanuel.
VERSE 2
Kedu ebe amụrụ onye nzọpụta?
Ọ bụ n'ụlọ anụ.
Na Bethlehem nke Judea,
Ka amụrụ nwa ka nwa.
VERSE 3
Enyere y'onyinye ndị eze.
Ọlaedo, myrrh na frankincense,
Bụ onyinye ndị eze atọ nyere ya.