Ekwerem N'Otu Chineke by Francis Okechukwu — Lyrics

Francis Okechukwu Igbo Creed (I believe) Mass Settings Solfa notation

Full Lyrics

Ekwerem n'otu Chineke Nna ji ike niile Ekwerem n'otu Chukwu Nna ji ike niile Onye kere igwe na ụwa Na ihe niile a pụrụ ịhụ anya Na ndị a pụghị ịhụ anya Ekwerem n'otu Chukwu Nna ji ike niile Ekwerem n'otu Onye nwe anyị Jesu Kristi Nwa a mụrụ n'otu nke Chineke Nwa a mụrụ tupu awatụ ụwa niile Chineke si na Chineke Ihe si n'ihe Ezi Chineke si n'ezi Chineke A mụrụ ya amụ e meghie ya eme Ya na Nna bụ otu ihe Onye sitere na ya mee ihe dum Onye maka anyị bụ mmadụ Na maka nzọpụta anyị Si n'eluigwe gbadata O wee rahụ na Virgin Maria Site na Mmụọ Nsọ, O buru mmadụ A kpọgburu ya n'obe n'ihi anyị N'oge Pontius Pilate O taa ahụhụ e lie ya N'ụbọchị nke atọ O bilite n'ọnwụ Ka akwụkwọ nsọ siri kwuo O bilite n'ọnwụ O rigo n'eluigwe Nọrọ n'aka nri Nna O gaabịaghachi ọzọ n'ebube Ikpe ndị dị ndụ na ndị nwụrụ anwụ ikpe Onye ọchịchị ya n'enweghị njedebe Ekwerem na Mmụọ Nsọ Onye nwe anyị na Onye n'enye ndụ Onye si na Nna na Nwa pụta Onye a n'esekpu isi nye Ya na Nna na Nwa Onye si n'ọnụ ndị amụma kwuo okwu Ekwerem n'otu nzukọ nsọ Dị otu, dị nsọ Bụ nke Katolik na nke Apostolik Ekwupụta m otu mmiri chukwu Maka mgbaghara njọ A nam atụ anya mbilite n'ọnwụ Nke ndị nwụrụ anwụ Na ndụ nke ụwa g'abịa. Amen.

Download the sheet music

Ekwerem N'Otu Chineke

Ekwerem N'Otu Chineke

By Francis Okechukwu
Solfa
Igbo
4 pages
1 Downloads
Creed (I believe) Mass Settings
0 0

More lyrics you may want