Full Lyrics
Ekwerem n'otu Chineke
Nna ji ike niile
Ekwerem n'otu Chukwu
Nna ji ike niile
Onye kere igwe na ụwa
Na ihe niile a pụrụ ịhụ anya
Na ndị a pụghị ịhụ anya
Ekwerem n'otu Chukwu Nna ji ike niile
Ekwerem n'otu Onye nwe anyị Jesu Kristi
Nwa a mụrụ n'otu nke Chineke
Nwa a mụrụ tupu awatụ ụwa niile
Chineke si na Chineke
Ihe si n'ihe
Ezi Chineke si n'ezi Chineke
A mụrụ ya amụ e meghie ya eme
Ya na Nna bụ otu ihe
Onye sitere na ya mee ihe dum
Onye maka anyị bụ mmadụ
Na maka nzọpụta anyị
Si n'eluigwe gbadata
O wee rahụ na Virgin Maria
Site na Mmụọ Nsọ, O buru mmadụ
A kpọgburu ya n'obe n'ihi anyị
N'oge Pontius Pilate
O taa ahụhụ e lie ya
N'ụbọchị nke atọ O bilite n'ọnwụ
Ka akwụkwọ nsọ siri kwuo
O bilite n'ọnwụ
O rigo n'eluigwe
Nọrọ n'aka nri Nna
O gaabịaghachi ọzọ n'ebube
Ikpe ndị dị ndụ na ndị nwụrụ anwụ ikpe
Onye ọchịchị ya n'enweghị njedebe
Ekwerem na Mmụọ Nsọ
Onye nwe anyị na Onye n'enye ndụ
Onye si na Nna na Nwa pụta
Onye a n'esekpu isi nye
Ya na Nna na Nwa
Onye si n'ọnụ ndị amụma kwuo okwu
Ekwerem n'otu nzukọ nsọ
Dị otu, dị nsọ
Bụ nke Katolik na nke Apostolik
Ekwupụta m otu mmiri chukwu
Maka mgbaghara njọ
A nam atụ anya mbilite n'ọnwụ
Nke ndị nwụrụ anwụ
Na ndụ nke ụwa g'abịa.
Amen.