EKWERE M N'OTU CHINEKE by Joshua S. Ugwuanyi — Lyrics

Joshua S. Ugwuanyi Igbo Creed (I believe) Mass Settings Staff & Solfa notation

Full Lyrics

REFRAIN Ekwere m n'otu Chineke, Nna ji ike niile. Ekwem n'otu Chineke, Nna ji ike niile. VERSE 1 Nna j'ike niile Onye mere Eluigwe na ala, na ihe niile a pụrụ ịhụ anya, na ndị a pụghị ịhụ anya. Ya na otu Onyenweanyị, Jesu Kristi, So otu Nwa Chineke mụrụ, Nna mụrụ tupu ụwa tụwa niile. VERSE 2 Chukwu si na Chukwu, Ihe si n'ihe, Ezi Chukwu si n'Ezi Chukwu, amụrụ amụ, emeghị eme, Ya na Nna bụ otu ihe n'ọdịdị ebighị ebi ha jiri bụrụ Chukwu Onye e si na ya mee ihe dum. Onye mak'ihi anyị bụ mmadụ na maka ihi nzọpụta anyị siri n'eluigwe gbadata. O were ahụ na Vejin Maria, site na Mmụọ Nsọ Ọ bụrụ Mmadụ. VERSE 3 Akpọgbuo ya n'obe n'ihi anyị n'oge ọchịchị Pọntus Paịlet; Ọ taa ahụhụ ọnwụọ, elie ya. Ma Ọ bilitere n'ụbọchị nke atọ, ka Akwụkwọ Nsọ si kwuo Ọ rogoro n'elu Igwe nọrọ n'aka nri Nna. Ma ọ gaabịaghachi ọzọ n'ebube ya, ikpe ndị dị ndụ na ndị nwụrụ anwụ ikpe, Onye ọchịchị ya naenweghị njedebe. VERSE 4 Ekwere m na Mmụọ Nsọ, Dinwenu na Onye naenye ndụ: Onye si na Nna na Nwa pụta. Onye a naesekpuru naetokọdọ ya na Nna na Nwa: Onye si na Ndị amụma kwuo okwu. VERSE 5 Ekwere m na Nzukọ nke dị otu, dị Nsọ, bụrụ Katọlik na Apọstọlik. Ekwupụta m otu Mmiri Chukwu maka mgbaghara njọ ga A na m atụ anya mbilite n'ọnwụ ndị nwụrụ anwụ, na ndụ ụwa gaabịanụ. Amen, amen, amen, amen. Amen.

Download the sheet music

EKWERE M N'OTU CHINEKE

EKWERE M N'OTU CHINEKE

By Joshua S. Ugwuanyi
Staff & Solfa
Igbo
6 pages
3 Downloads
Creed (I believe) Mass Settings
0 0

More lyrics you may want