EKWERE M N'OTU CHINEKE by Fr. Bart C. Ezeokafor — Lyrics

Fr. Bart C. Ezeokafor Igbo Creed (I believe) Mass Settings Solfa notation

Full Lyrics

INTRO / REFRAIN Ekwere m, Ekwere m, Ekwere mo! Ekwere mo! Ekwere m n'otu Chineke. VERSE 1 Nna ji ike niile Onye kere eluigwe na ala na ihe niile a naahụ anya na ndị a pụghị ịhụ anya. VERSE 2 Na n'otu Onyenweanyị Jesu Kristi, s'otu Nwa Chineke mụrụ, Nna mụrụ tupu ụwa niile Chukwu si na Chukwu, ihe si n'ihe, Ezi Chukwu si n'ezi Chukwu. VERSE 3 A mụrụ amụrụ emeghị eme Ya na Nna bụ otu ihe n'ọdịdị e ji ha bi Ha ji bụrụ Chukwu: Onye si na Ya mee ihe dum Onye maka'hi anyị bụ mmadụ na Maka'hi nzọpụta anyị siri n'eluigwe gbada. VERSE 4 O were ahụ na Virgin Maria; site na Mmụọ Nsọ Ọ bụrụ mmadụ. A kpọgbuo ya n'obe n'ihi anyị, n'oge ọchịchị Pontius Pilate; Ọ taa ahụhụ, nwụọ, e lie Ya Ma Ọ bilitere n'ụbọchị nke atọ k'Akwụkwọ Nsọ kwu Ọ rịgoro n'eluigwe nọ n'aka nri Nna Ọ gaabịaghachi ọzọ n'ebube ikpe ndị dị ndụ na ndị nwụrụ anwụ ikpe Onye ọchịchị Ya naenweghị njedebe. VERSE 5 Ekwere m na Mmụọ Nsọ Dinwenu na Onye naenye ndụ: Onye si na Nna na Nwa pụta Onye a naesekpuru naeto Nna na Nwa Onye si na ndị amụma kwu okwu. VERSE 6 Ekwere m na Nzukọ nke dị otu, dị nsọ, bụrụ Katolik, na Apostolik. Ekwuputa m otu mmirichukwu maka mgbaghara njọ ga. Ana m atụ anya mbilite n'ọnwụ ndị nwụrụ anwụ, na ndụ ụwa gaabịa. Amen, Amen, Amen.

Download the sheet music

EKWERE M N'OTU CHINEKE

EKWERE M N'OTU CHINEKE

By Fr. Bart C. Ezeokafor
Solfa
Igbo
3 pages
2 Downloads
Creed (I believe) Mass Settings
0 0

More lyrics you may want