Full Lyrics
INTRO / REFRAIN
Ekwere m, Ekwere m,
Ekwere mo! Ekwere mo!
Ekwere m n'otu Chineke.
VERSE 1
Nna ji ike niile Onye kere eluigwe na ala
na ihe niile a naahụ anya na ndị a pụghị ịhụ anya.
VERSE 2
Na n'otu Onyenweanyị Jesu Kristi, s'otu Nwa Chineke mụrụ,
Nna mụrụ tupu ụwa niile
Chukwu si na Chukwu, ihe si n'ihe,
Ezi Chukwu si n'ezi Chukwu.
VERSE 3
A mụrụ amụrụ emeghị eme
Ya na Nna bụ otu ihe n'ọdịdị e ji ha bi
Ha ji bụrụ Chukwu:
Onye si na Ya mee ihe dum
Onye maka'hi anyị bụ mmadụ na
Maka'hi nzọpụta anyị siri n'eluigwe gbada.
VERSE 4
O were ahụ na Virgin Maria; site na Mmụọ Nsọ Ọ bụrụ mmadụ.
A kpọgbuo ya n'obe n'ihi anyị, n'oge ọchịchị Pontius Pilate;
Ọ taa ahụhụ, nwụọ, e lie Ya
Ma Ọ bilitere n'ụbọchị nke atọ k'Akwụkwọ Nsọ kwu
Ọ rịgoro n'eluigwe nọ n'aka nri Nna
Ọ gaabịaghachi ọzọ n'ebube ikpe ndị dị ndụ na ndị nwụrụ anwụ
ikpe Onye ọchịchị Ya naenweghị njedebe.
VERSE 5
Ekwere m na Mmụọ Nsọ Dinwenu na Onye naenye ndụ:
Onye si na Nna na Nwa pụta
Onye a naesekpuru naeto
Nna na Nwa Onye si na ndị amụma kwu okwu.
VERSE 6
Ekwere m na Nzukọ nke dị otu, dị nsọ, bụrụ Katolik, na Apostolik.
Ekwuputa m otu mmirichukwu maka mgbaghara njọ ga.
Ana m atụ anya mbilite n'ọnwụ ndị nwụrụ anwụ, na ndụ ụwa gaabịa.
Amen, Amen, Amen.