Full Lyrics
REFRAIN I
Ekwere m n'otu Chineke Nna,
Onye mere igwe n'ala,
Ihe niile a naahụ anya
Na nke a naadịghị ahụ anya.
VERSE 1
Ya n'otu Onyenwe anyị Jesu Kristi,
Nwa ọkpara Chineke mụrụ sọ n'otu,
Nna mụrụ tupu oge niile.
Chineke si na Chineke, Ihe si n'Ihe,
Ezi Chineke si n'Ezi Chineke.
A mụrụ ya amụ, e keghị eke,
Ya na Nna bụ otu n'ihe ha ji bụrụ Chineke.
Onye e si na ya mee ihe niile.
Maka anyị bụ mmadụ na maka nzọpụta anyị,
O si n'igwe gbadata.
VERSE 2
Site na Mmụọ Nsọ,
O wee yiri ahụ n'afọ Nwa agbọghọ di naamaghị bụ Maria,
Wee ghọọ mmadụ.
A kpọgburu ya n'obe n'ihi anyị n'oge Ọchịchị Pọntiọs Pịlat,
O wee taa ahụhụ nwụọ, e lie ya.
O bilitekwara n'ụbọchị nke atọ dịka akwụkwọ Nsọ siri kwuo.
REFRAIN II
O bilitekwara n'ọnwụ,
O bilitekwara n'ọnwụ,
O bilitekwara n'ọnwụ Nna.
VERSE 3
Ọ rigo n'eluigwe, nọrọ n'aka nri Nna.
Ọ gaabịa ọzọ n'ebube ya
Ikpe ndị dị ndụ na ndị nwụrụ anwụ ikpe.
Ọchịchị ya agaghị enwe njedebe.
VERSE 4
Ekwere m na Mmụọ Nsọ,
Onye nwe anyị na Onye naenye ndụ.
Onye si na Nna na Nwa pụta.
N'etọkọdọ ya na Nna na Nwa,
Onye si n'ọnụ ndị amụma kwuo okwu.
VERSE 5
Ekwere m n'otu nzụkọ Nsọ,
Katolik na Apọstọlik.
A kwupụta m otu Baptisma nke mgbaghara njọ.
A na m atụ anya mbilite n'ọnwụ ndị nwụrụ anwụ,
Na ndụ ụwa gaabịa. Amen.
Amen, Amen, Amen.