Full Lyrics
CHORUS
Ekwe m n'otu Chineke
Nna jị ike niile,
Onye mere eluigwe n'ala.
VERSE 1
Na ihe dum a naahụ anya,
na ndị a naghị ahụ anya,
Ya n'otu Onyenweanyị Jesu Kristi,
sọ otu nwa Chineke mụrụ,
Nna mụrụ tupu e kee ụwa niile,
Chukwu si na Chukwu,
Ihe si n'ihe,
Ezi Chukwu si n'ezi...
VERSE 2
Amụrụ ya amụ, emeghị ya eme,
Ya na Nna bụ otu n'ihe ha ji bụrụ Chukwu.
Onye si na ya mee ihe dum,
Onye maka ihi anyị bụ mmadụ,
na maka nzọpụta anyị,
si n'eligwe gbadata,
O were ahụ na Virgin Maria,
site na Mmụọ Nsọ bụrụ mmadụ.
VERSE 3
A bịa kpọgbue ya n'obe n'ihi anyị
n'oge ọchịchị Pontius Pilate.
Ọ taa ahụhụ nwụọ, e lie ya.
N'ụbọchị nke atọ, o bilite n'ọnwụ
dịka akwụkwọ nsọ siri kwuo.
Ọ rigo n'eligwe,
ọ nọ n'aka nri Nna.
VERSE 4
M'ọ gaabịa ọzọ n'ebube ya
ikpe ndị dị ndụ na ndị nwụrụ anwụ ikpe.
Onye ọchịchị ya enweghị njedebe.
Ekwem na Mmụọ Nsọ,
Onyenweanyị, Onye naenye ndụ.
Onye siri na Nna na Nwa pụta.
Onye a naesekpuru...
VERSE 5
N'etukọdọ ya na Nna na Nwa,
Onye si na ndị amụma kwuo okwu.
Ekwem n'otu nzukọ nsọ Katolik n'Apostolik.
Ekwuputam otu baptism nke mgbaghara njọ.
A na m atụ anya mbilite n'ọnwụ ndị nwụrụ anwụ,
na ndụ ụwa gaabịa nụ,
Amen, Amen.