Full Lyrics
CHORUS
Ekwem n'otu Chineke,
Nna ji ike nile,
Onye mere 'ligwe n'ala.
Ekwem n'otu Chineke,
Nna ji ike nile,
Onye mere 'ligwe n'ala.
VERSE 1
Ekwem n'Otu Chineke, Nna ji ike nile,
Onye mere eligwe na ala,
N'ihe dum a naahụ anya, na ndị anaghị ahụ anya.
Ya na Otu Onye nwe anyị, Jesu Kristi sọ Otu Nwa Chineke mụrụ:
Nna mụrụ tupu ụwa tụwa nile.
VERSE 2
Chukwu si na Chukwu, Ihe si na Ihe.
Ezi Chukwu si na ezi Chukwu.
A mụrụ amụ, emeghị eme,
Ya na Nna bụ Otu Ihe n'ihe ha ji bụrụ Chukwu,
Onye esi na Ya mee ihe dum.
VERSE 3
Maka ihi anyị bụ mmadụ na maka ihi nzọpụta anyị,
Siri n'eligwe gbadala.
O were ahụ na Virgin Maria site na Muọ Nsọ, O bụrụ mmadụ.
A bịa kpọgbuo ya n'obe n'ihi anyị n'oge ọchịchị Pontus Pilate.
VERSE 4
O taa ahụhụ O nwụọ elie ya:
Ma O bilitere n'ụbọchị nke atọ, ka akwụkwọ nsọ si kwuo.
O rogoro n'eligwe nọrọ n'akanri Nna.
Ma O gaabịaghachi ọzọ n'ebube ya,
Ikpe ndị dị ndụ na ndị nwụrụ anwụ ikpe.
VERSE 5
Onye ọchịchị ya enweghị njedebe.
Ekwem na Muọ Nsọ, Onye nwe anyị naenye ndụ.
Onye siri na Nna na Nwa pụta.
Onye a naesekpuru, naeto kọ dọ, ya na Nna na Nwa:
Onye si na ndị amụma kwuo okwu.
VERSE 6
Ekwem n'Otu Nzukọ Nsọ Katolik, na Apostolik,
Ekwupụta m Otu Baptism nke mgbaghara njọ.
A na m atụ anya mbilite n'ọnwụ ndị nwụrụ anwụ,
Na ndụ ụwa gaabịanụ.
CODA
Amen, Amen, Amen, Amen.