Full Lyrics
MALE SOLO
Ndi otu Kristi ndi nwe m k'anyi kwuputanu okwukwe anyi o
CHORUS
Ekwerem n'Otu Chineke, a ee ee a ee, Nna ji ike nile
Ndi Otu Kristi unu ndi nwe m k'anyi kwuputanu okwukwe anyi o
Ekwerem n'Otu Chineke, a ee ee a ee, Nna ji ike nile
A ee ee a ee, Onye mere Eluigwe n'ala e
Ihe dum a na ahu anya, na ihe dum a na ahu anya
Umu Nnaa e, na ndi ana naghi ahu anya
Ya na Otu Onyenweanyi Jesu Kristi di na mbido
Ekwerem na Ya o
So Otu Nwa Chineke muru, Nna muru ee tupu uwatuwa nile
Chukwu si na Chukwu, ee a ee, Ezi Chukwu si n'Ezi Chukwu
Amuru amu emeghi eme, Ya na Nna bu Otu ihe n'ihe ha ji buru Chukwu
Onye esi na Ya mee ihe dum, ee a ee, Onye mak'ihi anyi bu mmadu
Na mak'ihi nzoputa anyi siri n'Eluigwe gbadata
O wer'aru n'a Virgin Maria site na Muo Nso O buru mmadu, ewo
Ee a ee a, abia kpogbuo Ya n'obe nihi anyi n'oge ochichi nke Pontius Pilate, ewo
Umu nnaa e, O taa ahuhu, O nwuo E lie Ya o
Ma O bilitere n'ubochi nke ato o
Ekwerem na Ya o
Dika AkwukwoNso si kwuo, O ragoro n'Eluigwe noro n'aka nri Nna ee
O ga abia ozo, O ga abia ghachi ozo n'ebube Ya
Ikpe ndi di ndu na ndi nwuru anwu ikpe
Ndi Otu Kristi anyi e, Ony'ochichi Ya n'enweghi njedebe
Ekwerem na MuoNso, Onye nwe ndu n'e nye ndu
Onye si na Nna na Nwa puta, Onye an'esekpuru n'etoko do Ya na Nna na Nwa
Ekwerem na Ya o
Onye si n'andi Amuma kwuo okwu
Ekwerem n'Otu Nzuko Nso Katolik na Apostolik
Ee a ee, E kwuputam Otu Baptism nke mgbaghara njo
A na m atu anya mbilitere n'onwu ndi nwuru anwu
Na ndu uwa ga abia nyu o
Amen, Amen, Amen, Amen, Amen, Amen, Amen