EKWEM N'OTU CHINEKE (I BELIEVE IN ONE GOD) by Okwy Tony Umeh (Rev. Fr.) — Lyrics

Okwy Tony Umeh (Rev. Fr.) Igbo Creed (I believe) Mass Settings Hymns Solfa notation

Full Lyrics

CHORUS E kwem n'otu Chineke Nna j'ike n'ile Onye mere eluigwe n'ala VERSE 1 a) Ekwe m n'otu Chineke, Nna ji ike nile, Onye mere eligwe n' ala, nihe dum ana ahu anya, na ndi anaghi ahu anya. b) Ya na otu Onyenwe anyi, Jesu Kristi, so otu Nwa Chineke muru: Nna muru tupu uwatuwa nile. VERSE 2 a) Chukwu si na Chukwu, Ihe si na ihe, Ezi Chukwu si n'Ezi Chukwu, A muru amu, emeghi eme. b) Ya na Nna bu otu ihe n'ihe ha ji buru Chukwu, Onye esi na ya mee ihe dum. VERSE 3 a) Onye maka ihi anyi bu mmadu na maka ihi nzoputa anyi, siri n'eluigwe gbadata OWERE AHU NA VIRGIN MARIA SITE NA MUO NSO. b) O BURU MMADU, a bia kpogbue ya n'obe n'ihi anyi n'oge ochichi Pontus Pilate. VERSE 4 a) O taa ahuhu, O nwuo, E lie ya. Ma O bilitere n'ubochi nke ato, ka akwukwo nso si kwu. b) O rogoro n'eluigwe noro n'aka nri Nna. Ma O gaabiaghachi ozo n'ebube ya, ikpe ndi di ndu na ndi nwuru anwu ikpe. VERSE 5 a) Onye ochichi ya enweghi njedebe. Ekwe m na Muo Nso, Onyenwe anyi naenye ndu; Onye siri na Nna na Nwa puta. b) Onye anaesekpuru, naetokodo, ya na Nna na Nwa; Onye si na ndi Amuma kwuo okwu. VERSE 6 a) Ekwe m n'otu Nzuko Nso Katolik, na Apostolik, e kwuputa m otu baptism nke mgbaghara njo. b) A na m atu anya mbilite n'onwu ndi nwuru anwu, na ndu uwa gaabianu. Amen. AMEN Amen, Amen, Amen, Amen, Amen, Amen.

Download the sheet music

EKWEM N'OTU CHINEKE (I BELIEVE IN ONE GOD)

EKWEM N'OTU CHINEKE (I BELIEVE IN ONE GOD)

By Okwy Tony Umeh (Rev. F...
Solfa
Igbo
1 page
9 Downloads
Creed (I believe) Mass Settings Hymns
1 0

More lyrics you may want