EKWE M N'OTU CHINEKE by Okwy Tony Umeh (Rev. Fr.) — Lyrics

Okwy Tony Umeh (Rev. Fr.) Igbo Creed (I believe) Mass Settings Solfa notation

Full Lyrics

CHORUS E kwem n'otu Chineke, Nna ji ike n'ile, Onye mere eluigwe n'ala. VERSE 1 Ekwe m n'otu Chineke, Nna ji ike nile, Onye mere eligwe n'ala, N'ihe dum a naahu anya, na ndi a naghi ahu anya. Ya na otu Onye nwe anyi, Jesu Kristi, So otu Nwa Chineke muru: Nna muru tupu uwa tuwa nile. VERSE 2 Chukwu si na Chukwu, Ihe si na ihe, Ezi Chukwu si n'Ezi Chukwu, A muru amu, emeghi eme. Ya na Nna bu otu ihe n'ihe ha ji buru Chukwu, Onye e si na ya mee ihe dum. VERSE 3 Onye maka ihi anyi bu mmadu na maka ihi nzoputa anyi, Siri n'eluigwe gbadata. O were ahu na Virgin Maria site na Muo Nso. O buru mmadu, a bia kpogbuo ya n'obe N'ihi anyi n'oge ochichi Pontus Pilate. VERSE 4 O taa ahuhu, O nwuo, e lie ya. Ma O bilitere n'ubochi nke ato, ka akwukwo nso si kwu. O rogoro n'eluigwe noro n'aka nri Nna. Ma O gaabiaghachi ozo n'ebube ya, Ikpe ndi di ndu na ndi nwuru anwu ikpe. VERSE 5 Onye ochichi ya enweghi njedebe. Ekwe m na Muo Nso, Onye nwe anyi naenye ndu; Onye siri na Nna na Nwa puta. Onye a naesekpuru, naetokodo, ya na Nna na Nwa; Onye si na ndi Amuma kwuo okwu. VERSE 6 Ekwe m n'otu Nzuko Nso Katolik, na Apostolik, E kwuputa m otu baptism nke mgbaghara njo. A na m atu anya mbilite n'onwu ndi nwuru anwu, Na ndu uwa gaabianu. Amen. AMEN Amen, Amen, Amen, Amen.

Download the sheet music

EKWE M N'OTU CHINEKE

EKWE M N'OTU CHINEKE

By Okwy Tony Umeh (Rev. F...
Solfa
Igbo
1 page
6 Downloads
Creed (I believe) Mass Settings
1 0

More lyrics you may want