Ekeresimesi Erutego by Jude Nnam — Lyrics

Jude Nnam Igbo Christmas Entrance songs Recessional / Dismissal Hymns Hymns Solfa notation

Full Lyrics

REFRAIN Ekeresimesi erutego, Ekeresimesi k'anyi nuria, K'anyi nuria nu na Kristi nwa Chineke abiago, Ekeresimesi erutego eh! Ojekene nu but'igba n'egwuoma n'ogene nke rutego, Kua mgbirigba eh! Gbam! Gbam! Gbam! Koro! Koro! Biam kiri rim kiri! Kua mgbirigba eh! Gbam! Gbam! Gbam! Koro! Koro! Biam kiri rim kiri! Biko kua mgbirigba eh! Nwa Chineke abiago, Kua mgbirigba eh! Ekeresimesi abiago, Ekeresimesi erutego. VERSE 1 Jesu nwa Chineke amuru ya n'ul'anu, N'im'ahihia k'amuru ya, Mary Nne ya, gbobe y'akwa, Wee nyibe Ya n'agbuke. VERSE 2 Ndi nch'aturu no n'im'ohia n'etiti abali, Ha n'ech'aturu ha, aturu ha n'akpara nri. Na ntumade, Mmuozi nke Chukwu biakwutere ha, Ebube ha zuru h'ahu. VERSE 3 Nnukwu egwu jidere ha, obi mmapu jide ha, Mmuozi gwara ha si ha unu atul'egwu, N'obodo David taa amut'ar'unu, Onyenzoputa Kristi Dinwenu. VERSE 4 Ndi ez'ato, si n'owuw'anyanwu bia. Ha n'acho Eze amuru ohuru, Kpakpando wee puta, n'udi pur'iche, Wee duruo ha, n'eb'enyi bere ya.

Download the sheet music

Ekeresimesi Erutego

Ekeresimesi Erutego

By Jude Nnam
Solfa
Igbo
3 pages
12 Downloads
Christmas Entrance songs Recessional / Dismissal Hymns Hymns
0 0

More lyrics you may want