EKWEREMEKWE! [I Believe (In God)... An Igbo CREDO] by Alex Ugwu (OZIGE) — Lyrics

Alex Ugwu (OZIGE) Igbo Creed (I believe) Solfa notation

Full Lyrics

CHORUS Ekweremekwe n'otu Chineke Nna, Nna jike niine, Onye mere enwigwe n'ala. VERSE 1 Ma ihe niine a naafụ anya, Ma ndị a naghị afụ anya, Ekwerem n'otu Onyenweanyị Jesu Kristi, Nwa a mụrụ naanị, Onye Npa ya mụrụ tupu ụwa atụlụ anine, Chukwu si na Chukwu, Ihe si n'ihe, Ezi Chukwu si n'ezi Chukwu. VERSE 2 Onye a mụtaa amụta, Ekeeghi y'eke, Onye ya na Nna bu otu udi, Onye e sina ya kee ihe niine, Onye maka anyị bu mmadụ, Na maka nzọpụta anyị, Si n'enwigwe gbadata, O wee ghụ na Vegin Maria site na Mụọnsọ, O wee mee yammadụ. VERSE 3 A bịa kpọgbuo ya n'obe n'ihi anyị, N'oge Pọntiọs Paịlet o taa ahụhụ, Nwụọ, elie ya! Ma n'ụbọchị nke atọ, O bilitere n'ụbọsịnka atọ ka akwụkwọnsọ siri kwuo, Rịgoro n'enwigwe, Nọ n'akanrịnna! CODA Ọ gaabịaghachi n'ebube ya, Ikpe ọdịndụ na ndị nwụrụanwụ ikpe, Onye ọchịchị ya e nweghị njedebe. E kwere mekwe na Mụọnsọ, Onye nwe anyị na onye n'enye ndụ, Onye si na Nna na Nwa pụta, Onye a nasekpuru nye sọpụrụ ya na Nna na Nwa, Onye siri n'ọnụ ndị amụma kwuo. E kwere mekwe n'otu nzụkọ di asọ, Katọlịk n'apọstọlịk. E kwere m n'otu baptịsma n'ihi mgbaghara njọ. A na m atọ anya nmbilite n'ọnwụ ndị nwụrụ anwụ, Na ndụ ụwa gaabịazị. Amen, Amen, Amen, Amen, Amen, Amen, Amen.

Download the sheet music

EKWEREMEKWE! [I Believe (In God)... An Igbo CREDO]

EKWEREMEKWE! [I Believe (In God)... An Igbo CREDO]

By Alex Ugwu (OZIGE)
Solfa
Igbo
3 pages
103 Downloads
Creed (I believe)
1 0

More lyrics you may want