Full Lyrics
[CHORUS]
Ekele ọma m o kam ji bịa nụ
Bịa o k'anyị kelese
Enyinye ọma ya k'onyere m o
Onye nwere ịhụnanya n'enweghị mgbanwe
Okwesịrị k'anyị nye ya ezi ekele
Chukwu n'igwe, ezi Chukwu
[SOLO 1]
K'anyị kele ezi Nnam o
Nara nk'anyị ji bịa
[SOLO 2]
Chetakwa ọgwụ ike nke o nyere gị
[CHORUS]
Ekele m o kam gaenye Chukwu
Ọ bụrụ na Chukwu m bụ mmadụ
Onye gaecheta m o?
Onye, m'ọbụghị Chukwu, m'ọbụghị Chukwu m
Onye dịka Chukwu dị ebube?
Ọ bụ ya bụ Eze dị ebube m o
[SOLO 3]
K'anyị kele Chukwu, ezi enyi nwogbe
Nye bịa kele ya
[SOLO 4]
Chetakwa ndụ nke o nyere gị o
Biko nwanne m
[CHORUS]
Ihe ọma ya naamasị m o
O Chukwu m o Eze
Ebube n'eme mma
Too ya, too ya, makụnie k'anyị kele ya bụ Eze
Ihe ọma ya baram ụba
Chukwu ọma, o k'anyị kele ya o, onye ọma o
[MALE DUET]
Ngozi ya baram ụba, bịa kele ya o
[CHORUS]
Chukwu ọma, o Chukwu m dị ebube
Too k'anyị gbara ya egwu
Egwu ọma o, kuo nụ ịgba
Iye, iye biko
Kwenu kwenu, iye iye iye
O gbara ya egwu ọma
O kunie gbara ya o, gbara ya
K'anyị gbara ya egwu doo!
Bụ Eze, Eze dimma, kele ya kwenu ya
N'ezi obi bịa kele ya n'ihe o mere m
Too nụ ya n'ihe o meerem
Kwere ya ukwe ọma, ezi Chukwu m o
[CODA]
Bịa o! Nyenụ ya ihe kachasị mma
Bịa o! Bịa nye ya ezi ekele
[SOLO A]
Bịa nụ kele Eze dị nso
Enyi ụmụ ogbenye o! Bịa o
[SOLO B]
Kwenu ya egwu ọrịtọ kwesịrị ya, too nụ ya
[SOLO C]
Bịa kele Chukwu, ihe ọma ya kachasị mma o
[ENDING CHORUS]
N'obi ọma Nna nara
Onyinye m nyere ọma Nna nara
N'obi ọma Nna nara
N'ihe ọma nke Chukwu nyere m o.