Full Lyrics
[INTRO]
Ave Ave Ave Ave Ave Ave Maria
[CHORUS]
Ave Ave Ave Ave Ave Ave Maria
Jupụtara n'amara Nne
Ekene, ekene dịrị Gị
Dịrị Gị Maria
Dịrị Gị Nwaanyị ọma
Ezigbo Nne
[VERSE 1]
N'etiti ụmụ nwaanyị niile
Bụ onye dị ukwu
Bụ onye dị ngozi
Rịọbara anyị arịrịọ eh
Rịọbara anyị arịrịọ eh
Dị ka na Kana Galili O
[VERSE 2]
Ọ dị ngozi, Ọ dị ngozi, Odogwu
Ọ dị ngozi bụ Nwafọ Gị Jesu
Mezaya bụ Nwafọ Gị Jesu
Chukwu n'onwe Ya bụ Nwafọ Gị Jesu
Eze udo bụ Nwafọ Gị Jesu
Ọ g'achị chị chị chị
Chịwa chịwa chịwa
Jigide jigide, de jigide
Chịwa mba niile O
[VERSE 3]
Maria bụ Nne nke Chukwu
Nne nke onye nwaanyị
Bụ onye dị ngozi
Onye dị ukwu
Mkpụrụ obi m ọ nụrịwa na Chineke
Mmụọ m gọribenụ
Gọribenụ gọribenụ
Na Dinwenu
Agbụrụ niile g'akpọ m
Ha g'akpọ m
Onye dị ngozi
Onye dị ukwu O