Full Lyrics
[CHORUS]
Ekele Maria, ee Ezinne,
Jupụtara na grastia, ee Ezinne Nneọma.
[VERSE 1]
Chineke gọziri gị chọọ gị mma Nne,
Oseburụwa nọyere gị,
Nne nke Chukwu.
[VERSE 2]
Ñụrịba, ñụrịba n'i nwere isi ọma,
Ị bụ Nne nke Onye kach'elu,
Nne nke Chukwu.
[VERSE 3]
Chebe nzukọ gị n'ụwa Nne,
Chebe ụgbọ nd'ije,
Nne nke Chukwu.
[VERSE 4]
Rịọbara nyị ndị njọ arịrịọ,
Nyekwara nyị aka,
N'oge ọnwụ.