Full Lyrics
[REFRAIN]
Eji m obi m nile, eji m obi m nile ekele Gị,
ekele Gị, eji m obi m ekele Gị,
Onyenweanyi n'ihi n'ị nụla ekpere m o,
Onye nwe m nara ekele.
Aga m ekwere gị ukwe n'ihu ndị mmụọzi.
Aga m akpọ isiala n'ụlọ nsọ gị,
nye gị ekele n'ihi aha gị,
na nkwa gị kacha dị elu.
[VERSE 1]
Ụbọchị m kpọrọ gị, ị zata m o,
mekwaa ka m bawanye.
Ndị eze nile nọ n'ụwa naekele Gị,
n'ihi na ha nụla banyere nkwa gị nile.
[VERSE 2]
Ha naekwupụta akọrọ nke Onyenweanyi naasị:
Otito ya dị ukwu.
Onyenweanyi n'esi n'eligwe eleta ndị ume ngwụrọ,
ndị ngala enwekwaghị ike izonahụ ya.
[VERSE 3]
Ọbụladị n'ansogbu gbatara m okirikiri,
ị n'echekwa ndụ m o.
Setịpụ aka gị zọpụta m o,
aka nri gị g'emere m ihe nile.
Onyenweanyi, ịhụnanya gị naadị ebebe.
Ahapụkwala anyị ndị i kere,
n'ihi na ịhụnanya gị naadị ebebe.