EJI M OBIM NILE EKELE GI by Stanley Oranusi — Lyrics

Stanley Oranusi Igbo Offertory Hymns Hymns Prayer Responsorial Psalms Solfa notation

Full Lyrics

[REFRAIN] Eji m obi m nile, eji m obi m nile ekele Gị, ekele Gị, eji m obi m ekele Gị, Onyenweanyi n'ihi n'ị nụla ekpere m o, Onye nwe m nara ekele. Aga m ekwere gị ukwe n'ihu ndị mmụọzi. Aga m akpọ isiala n'ụlọ nsọ gị, nye gị ekele n'ihi aha gị, na nkwa gị kacha dị elu. [VERSE 1] Ụbọchị m kpọrọ gị, ị zata m o, mekwaa ka m bawanye. Ndị eze nile nọ n'ụwa naekele Gị, n'ihi na ha nụla banyere nkwa gị nile. [VERSE 2] Ha naekwupụta akọrọ nke Onyenweanyi naasị: Otito ya dị ukwu. Onyenweanyi n'esi n'eligwe eleta ndị ume ngwụrọ, ndị ngala enwekwaghị ike izonahụ ya. [VERSE 3] Ọbụladị n'ansogbu gbatara m okirikiri, ị n'echekwa ndụ m o. Setịpụ aka gị zọpụta m o, aka nri gị g'emere m ihe nile. Onyenweanyi, ịhụnanya gị naadị ebebe. Ahapụkwala anyị ndị i kere, n'ihi na ịhụnanya gị naadị ebebe.

Download the sheet music

EJI M OBIM NILE EKELE GI

EJI M OBIM NILE EKELE GI

By Stanley Oranusi
Solfa
Igbo
4 pages
3 Downloads
Offertory Hymns Hymns Prayer Responsorial Psalms
0 0

More lyrics you may want