Full Lyrics
REFRAIN
Duru ndị Gị laba, ezi Chineke.
Gọzie ndị Gị n'ụje, biko gọzie ndị Gị n'ụla.
VERSE 1
K'anyị labanu n'udo, n'aja Missa gwusigo.
K'anyị kwusaba oziọma nke Chineke.
VERSE 2
Ndị agbatobi nile, ndị enyi na ikwun'ibe,
g'anụ oziọma nke Chineke na ndụ anyị n'ọfụọfụ.
VERSE 3
Ebe anyị n'alu ọlu, ebe anyị n'azụ ahịa,
ụwa g'anụ oziọma nke Chineke na ndụ anyị n'ọfụọfụ.