Full Lyrics
Onyegbula soro mu kelee Chineke,
Ndị mmụọ ozi n'etoo ya.
Onyegbula soro mu kele Dinwenu,
Ndị mmụọ ozi n'etoo ya.
Chukwu anyị naefe dị mma,
O meworo anyị ihe dị ukwu.
Eze ka Eze,
O meworo anyị ihe dị ukwu daalụ.
O Nna daalụ Eze,
Bụ Chukwu kere ụwa niile,
Nwa ya abịala, m bụ ọgabịa ọzọ.
O nweri ihe Chukwu onyeọma mere mo,
Ihe ezinụlọm apụghị imere mo.
Bulie ya elu, bulie ya elu,
Bulie ya elu, too ya, too ya.
Bulie ya elu, bulie ya elu,
Bulie ya elu, too ya, too ya.
Bulie ya elu, bulie ya elu,
Bulie ya elu, too ya, too ya.
Bulie ya elu e.
Ị bụ Chineke, Ị bụ Chineke,
Ị bụ Onyeọma, Ị bụ Onyeọma.
Dike Onyeọma, Ị bụ Chineke,
Ị bụ Onyeọma, Ị bụ Onyeọma.
Otito Ojirija, Ị bụ Chineke,
Ị bụ Onyeọma, Ị bụ Onyeọma.
E Odogwu sibe nbibi ọchaghị,
Ị bụ Chineke, Ị bụ Onyeọma, Ị bụ Onyeọma.
Chukwu ọma aka n'ehi, Onye dịka,
Ị bụ Chineke, Ị bụ Onyeọma, Ị bụ Onyeọma.
Ị g'adị eh.
Ị ma na Chineke bụ Chukwu,
Ị ma na Chineke bụ Chukwu,
Ekele Chukwu, Eneke bụ Odogwu.
Ị ma na Chineke bụ Chukwu,
Ị ma na Chineke bụ Odogwu.
Oneke bụ Odogwu.
Ị ma na Chineke bụ Chukwu,
Ị ma na Chineke bụ Odogwu.
[TENOR SOLO]
Keleenụ Chukwu Nna,
Onyeọma mee,
Kele Odogwu o,
Kelee ya, kelee ya.
[CHORUS]
Soro mu k'anyị too Chineke,
Ezigbo Chi, Ezigbo Chi.
Okemmiri naebu ogwe,
Ikuku naama n'ọnya,
[ALTO SOLO]
Dike n'agha, Nnukwu Chi,
Ezigbo Chukwu, Eze ndị eze niile,
Nnukwu Chi, Chukwu ọma,
Chukwu naechere mo,
Daalụ eh.
[CHORUS]
Ị ma na Chineke bụ Odogwu,
Ị ma na Chineke bụ Chukwu,
Ị ma na Chineke bụ Odogwu.
Ị ma na Chineke bụ Odogwu,
Ị ma na Chineke bụ Chukwu,
Ị ma na Chineke bụ Odogwu.
O Dinwenu bụ Jisos,
O Dinwenu bụ Jisos.
Ọ dịghị onye dị n'ụwa ka Gị,
Ọ dịghị onye dị n'ụwa ka Gị.
Ọ dịghị onye dị ka Gị,
Ọ dịghị onye dị ka Gị.