Full Lyrics
[SOLO]
Ndi otu Kristi ndinwe m k'anyi kwuputanu okwukwe anyio
[CHORUS]
Ekwerem n'otu Chineke a ee ee a ee
Nnaji ike nile a ee ee a ee
[SOLO]
Ndi otu Kristi unun dinwe m k'anyi kwuputanu okwukwe anyio
[CHORUS]
Ekwerem n'otu Chineke a ee ee a ee
Nnaji ike nile a ee ee a ee
Onye mere Eligwe n'ala e
Na ihe dum ahu anya
Na ndi a na naghi ahu anya
Yana Otu Onyenwe anyi Jesu Kristi
Otu Nwa Chineke muru Nna
So Otu Nwa Chineke muru Nna
Tupu uwa nile
Chukwu si na Chukwu
Ihe si n'ihe
Ezi Chukwu si n'Ezi Chukwu
Amuru amu emeghi eme ya na Nna bu otu ihe
N'ihe ha ji buru Chukwu
Onye nye esina ya mee ihe dum
Onye mak'ihi anyi bu mmadu
Na mak'nzoputa anyi siri n'Eligwe gbadata o
Site na Muo Nso o burum madu ewo
A bia kpogbuo ya n'obe n'ihi anyi
N'oge ochichi nke Pontius Pilato, ewo
O taa ahuhu o nwuo, elie ya o
O bilitere n'ubochi nke ato o
Dika Akwukwo Nso si kwuo
O ragoro n'Eligwe no n'aka nri Nna ee
O ga abia ozo n'ebube ya
Ikpe ndi di ndu na ndi nwuru anwu ikpe
Nke alaeze ya agaghi agwugwu
Ekwerem na Muo Nso onyenwe nu na enye ndu
Onye siri na Nna na Nwa puta
Onye a na esekpuru na etokodo ya na Nna na Nwa
Onye si na ndi Amuma kwuo okwu
Ekwerem n'otu Nzukoo Nso Katolika na Apostolik
E kwu puta otu Baptism nke mgbaghara njo
A nam atu anya mbilite n'onwu ndi nwuru anwu
Na ndu uwa ga abianu o
Amen, Amen, Amen, Amen, Amen, Amen, Amen, Amen, Amen.