Full Lyrics
CHORUS
Kristi n'akpọ mụ na gị
K'anyi jebe nu rie
Ọ n'akpọ anyị ụmụ Chineke
K'anyi jee n'altar ya
Ahụ n'ọbara Kristi bụ ezi nri ezi ọṅụṅụ
Bia rie nụ o g'enye gị ndụ n'uju
REFRAIN
Bia rie Kristi dị ụtọ
Kristi dị ụtọ ih'oriri
Kristi dị ụtọ nri ndi muozi n'eri
Anyị nwere isio ma anyị nwere isio ma
O bundi akporo n'oririn ke nwatụrụ Chukwu
VERSE 1
Ony'obula riri ahum g'ebiri n'imem
Ony'obula ṅụrọ obaram g'ebiri n'imem
O kwuru si m g'ebiri n'ime gị
M g'enye gị ndụ ebe m ga'gbanwọ ndụ gị
Detu Kristi ọnụ ka i hụ n'ọ dị ụtọ
VERSE 2
Jesu nnọọ bia biri n'imem
Chusa sịa ọchịchịrị nke obi mo
Benata agụụ nke ime m
Jesu Kristi mee mụ obi m ka ọ dị ka nke gị
VERSE 3
Kristi obi m chọrọ gị bianye mụ ndụ
Jesu sachaa m n'ọbara gị dị ọkụ nụ
Kam wee nwee ike iri ahụ gị
Ma ṅụọ ọbara gị n'obi dị ọcha