Full Lyrics
VERSE 1
Esekpuorom Gị Chukwu dị na nzizo
Onye nọ ezie n'ụdị Sacramenti,
E jim obim kwere n'ihe omimi nkea
Nke ka uche mmadụ.
VERSE 2
Aka, ọnụ, n'anya, enwegh' ike ịgwa anyị
Eziokwu dị na Sacrament dị nsọ
Ọ bụ ntị n'anụ okwu Jesu, kwere
Maka n'ọbụ Chukwu.
VERSE 3
N'elu obe sọsọ ụdị Chukwu zoro
N'elu altar ụdị nke mmadụ zokwara:
Ma esorolam onye ohi lọghara elọgha
Na akpọgị Dinwenu.
VERSE 4
Ahụbeghim ọnya Gị dika Thomas
Ma anam ekwuputa n'ịbụ Chukwu nkem
Mee k'Okwukwe, Nchekwube, n'Ihụnanya
N'ebuwanye n'obim.
VERSE 5
Ihe ncheta aja achụrụ na elu obe
Achịcha dị ndụ na enye mmadụ ezi ndụ
Mee ka obim si na Gị na enweta ndụ Ya.
Ka ọ hụ n'Ị dị ụtọ.
VERSE 6
Dika nnụnụ nii an'akpọ Pelikan
N'eji ọbara ya na azụ ụmụ ya nile
O Jesu, sachaa njọ m nime Ọbara Gị
Nke iji gbapụta ụwa.
VERSE 7
O Jesu, Onye nọ na nzuzo na ihu m
Anam arịọ Gị nye m onyinye m chọrọ
Ya bụ ka mụ na Gị hụ ihu na ihu
Na otito nke eligwe.