Full Lyrics
CHORUS
Chineke biko, gozi'ụlọ a wetara anyị udo.
VERSE 1
Ọ bụrụ na Chineke arụghị ụlọ,
N'efu ka ndị ọrụ naata ahụhụ.
Ọ bụrụ na Chineke echeghị obodo,
N'efu ka ndị nche mụrụ anya.
VERSE 2
Ọ bụ ihe efu iteta ụra n'ụzọ,
Hapụ ịlaba gboo,
Naagba mbọ ihe ị gaeri,
N'ihi na Chineke naenye ndị nke Ya ụra.
VERSE 3
Ụmụ bụ onyinye Chineke,
Ọmụmụ bụ ụgwọ Chineke naakwụ ndị nke Ya.
Ụmụ amụrụ n'okorobịa,
Dịka akụ n'aka dike.
VERSE 4
Aṅụrị bụ nke onye kpojuru n'akpa ya,
Agaghị imeri ya n'ize,
Na ndọrọ ndọrọ ya na ndị iro ya.
VERSE 5
Nye Nna na Nwa Ya otito,
Na Mmụọ Nsọ ebighebi.