Full Lyrics
INTRO
Eburula Ozioma bata n'ulo nso
Eburula Ozioma bata n'obodo anyi o
Ony'obula kulie k'anyi nabatanu Ozioma
Ony'obula kulie kwur'oto k'anyi nabatanu Ozioma
REFRAIN
Ozioma Ozioma Ozioma Chukwu abiala
Ozioma Ozioma Ozioma Chineke nnoo
VERSE 2
Okwu n'enye ndu
Okwu n'eny'udo
Okwu n'eny'amamihe
Okwu n'eziuzo eligwe
Jesu Kristi Dinwenu
O bu Gi n'abia
Okwu Gi bu Ozioma
Anyi ekele Gi
VERSE 3
Welie n'ek'unu elu
Kelenu Dinwenu
Dinwen'anyi ekele
Kelenu Eze nw'uwa ekele
Jesu Kristi Dinwenu
Okwuemer'ahu
Okwuemer'ahu
Okwu Gi bu Muo
Okwu Gi bu Ozioma
VERSE 4
Ihe Ozioma meer'anyi
Ihe Omeer'anyi ebuka
Ihe Ozioma weter'anyi
Ihe Oweter'anyi o bu ka
Ihe oma Ihe oma
Ihe oma nile sin'Ozioma
Ihe oma Ihe oma
Ihe oma nile sin'Ozioma
Onye r'anyi udo
Ihunanya n'ebe mmadu nile no
We weghachi ugwu nmadu ka Chineke si choo
VERSE 5
Akwu siri igb'ohu ekele diri Gi Ozioma
Akwu siri igo umuejima
Akwu siri iji madu achu aja ekele diri Gi
Ozioma ekele diri Gi
Ozioma ekele diri Gi
Ozioma ekele diri Gi
Ozioma ekele diri Gi
Ozioma
VERSE 6
Imegbu umunwanyi aga ekele diri Gi Ozioma
Ugw'umunwanyi akwurula chin ekele diri Gi Ozioma
Ekele diri Gi Ozioma
Ekele diri Gi Ozioma
VERSE 7
Ewetuo Ozioma onye g'agua kwukwo?
Ewetuo Ozioma nwanyi og'agu akwukwo?
Mbaa!
Ewetuo Ozioma oji n'ocha ha g'enwemmeko?
Mbaa!
Nzoputa biago
Nzoputa biago
Nzoputa sin'Ozioma anyi n'ekele Gi Ozioma
VERSE 8
Chukwu Muo nso biko bia
Meghee obianyi
Meghee obianyi
K'anyi nabata Okwu Chukwu
K'anyi nabata Okwu Chukwu
Were bibendu Ozioma
Were bibendu Ozioma
K'anyi bibendu di aso
K'anyi bibendu di aso
Were gbasaba Ozioma
Were gbasaba Ozioma