Chukwunyere by Emmanuel Nwofoke — Lyrics

Emmanuel Nwofoke Igbo Burial / Funeral Hymns Hymns Solfa notation

Full Lyrics

SOPRANO SOLO Laa n'udo, laa n'udo Nwannem emesịa anyị g'ahụ ọzọ n'igwe. CHORUS Chukwu nyere Chukwu ewerego eh Aheh ngozi dir'Aha Chineke Onye mere ndụ ewerego ya Biko Nna nabata ya n'udo. VERSE 1 Mgbe ọnwụ bịara ọ dịka chi ojiri n'ehihie. Ma chetakwa n'ọ bụ ọnwụ n'eweta ndụ. Anyị nile si n'Aka chukwu sịbịa Mgbe oge ruru anyị g'alakwuru Chukwu anyị. VERSE 2 Ụbọchị ọmụmụ nwa n'ụwa Nwa n'ebe tie ụwa! ụwa!! Mh Ndị ụwa n'achị n'amụrụnwa ọghụrụ Ụbọchị ọnwụ akwa n'ụwa ọṅụ n'igwe. VERSE 3 M'ịchọrọ m'ịchọghị ọnwụ gaabịarịrị Kụa kpom kpom Ọnwụ nchọghịma mgbe wutagị Nanị ihe ị g'eme nwannem bụ ka ị kwad'onwe gị K'ọ g'abụ mgbe ọ g'abịa ị makuo ya. VERSE 4 Chukwu kere anyị k'anyị yie ya Fu ya n'anya fee ya n'ụwa; K'ọ g'abụ n'ikpeazụ anyị ebinyere ya N'aṅụrị nke g'adigide ebebe.

Download the sheet music

Chukwunyere

Chukwunyere

By Emmanuel Nwofoke
Solfa
Igbo
2 pages
10 Downloads
Burial / Funeral Hymns Hymns
0 0

More lyrics you may want